Abụ nke 74
Ọṅụ Jehova
1. Ihe n’eme ugbu a n’akpọs’Al’eze.
Anyị n’ekwusa ozi ọma.
Weli’isi unu, tụ’anya nzọpụt’unu;
Oge nnapụt’unu dị nso!
(KORỌS)
Ọṅụ Jehova bụ ike anyị.
Bụ’abụ, tisie mkpu ọṅụ ike
N’aṅụrị ọṅụ n’olil’anya unu,
Ka ’madụ dum n’eto Chineke.
Ọṅụ Jehova bụ ike anyị.
’Madụ dum g’amar’aha ya.
A’yị g’efe Chinek’anyị mgbe niile,
Jirikw’ọṅụ n’ejere y’ozi.
2. Ndị enyi Jaa, tụkwasịnụ ya obi.
Atụl’egwu, ọ dị ike.
Tienụ mkpu n’olu n’ada oké ụda;
Bụkuonụ Chinek’abụ ọṅụ!
(KORỌS)
Ọṅụ Jehova bụ ike anyị.
Bụ’abụ, tisie mkpu ọṅụ ike
N’aṅụrị ọṅụ n’olil’anya unu,
Ka ’madụ dum n’eto Chineke.
Ọṅụ Jehova bụ ike anyị.
’Madụ dum g’amar’aha ya.
A’yị g’efe Chinek’anyị mgbe niile,
Jirikw’ọṅụ n’ejere y’ozi.
(Gụọkwa 1 Ihe 16:27; Ọma 112:4; Luk 21:28; Jọn 8:32.)