Abụ nke 82
Ṅomie Ịdị Obi Umeala Kraịst
Nke E Biri Ebi
1. Nwoke kach’ukwuu bụ Onyenw’anyị Jizọs;
O nwegh’oké ọchịchọ m’ọ bụ dị mpako.
Ọ bụ Ony’ukwu ná nzube Chineke;
Ma, ọ dị umeala n’obi mgbe niile.
2. Unu niile ndị e bor’ibu dị arọ,
Ọ n’akpọ unu bịa nyara yoku ya.
Unu g’enwet’ume n’ịchọ Al’eze.
Onyenw’anyị hụrụ ndị umeala n’anya.
3. Jizọs kwuru n’anyị niile b’ụmụnna.
Achọl’ịbụ ony’ukwu; jeere ndị ọz’ozi.
Chineke ji ndị dị umeala kpọr’ihe;
O kwere nkwa na ha g’eketa ụwa.