Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 97 p. 226-p. 227 para. 2
  • Mmụọ Nsọ Dakwasịrị Kọnịliọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmụọ Nsọ Dakwasịrị Kọnịliọs
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Pita Agaa Ịhụ Kọniliọs
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • “Chineke Anaghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Chineke Anaghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Jehova “Adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 97 p. 226-p. 227 para. 2
Ebe Kọnịliọs na-anabata Pita n’ụlọ ya

ISI NKE 97

Mmụọ Nsọ Dakwasịrị Kọnịliọs

E nwere otu onyeisi ndị agha Rom bi na Sizaria. Aha ya bụ Kọnịliọs. Ọ bụ nnukwu mmadụ. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị onye Juu, ma ndị Juu na-akwanyere ya ùgwù. Ọ na-enyere ndị ogbenye na ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka. Kọnịliọs nwere okwukwe na Jehova, na-ekpekwa ekpere mgbe niile. Otu ụbọchị, otu mmụọ ozi bịakwutere ya ma gwa ya, sị: ‘Chineke anụla ekpere gị. Ugbu a, ziga ndị mmadụ Jọpa, bụ́ ebe Pita nọ, ma gwa ya ka ọ bịa n’ụlọ gị.’ Kọnịliọs zigara mmadụ atọ Jọpa ozugbo. Jọpa dị ihe dị ka kilomita iri ise ma e si Sizaria gawa ebe ndịda.

Ma, ka Pita nọ na Jọpa, ọ hụrụ ọhụụ. N’ọhụụ ahụ, ọ hụrụ anụmanụ ndị a gwara ndị Juu erila. Ọ nụkwara olu gwara ya rie ha. Pita jụrụ iri ha ma kwuo, sị: ‘Eritụbeghị m anụmanụ na-adịghị ọcha.’ Olu ahụ gwaziri ya, sị: ‘Akpọla anụmanụ ndị a ihe na-adịghị ọcha. Chineke emeela ka ha dị ọcha.’ Olu ahụ gwakwara Pita, sị: ‘E nwere ụmụ nwoke atọ nọ n’ọnụ ụzọ na-achọ gị. Soro ha gawa.’ Pita gara n’ọnụ ụzọ ya, hụ ha ma jụọ ha ihe mere ha ji bịa. Ha gwara ya, sị: ‘Ọ bụ Kọnịliọs, onye Rom bụ́ onyeisi ndị agha, zitere anyị. Ọ sịrị anyị kpọọ gị ka ị bịa n’ụlọ ya na Sizaria.’ Pita kpọbatara ha n’ụlọ ya ka ha nọrọ ka chi bọọ. N’echi ya, Pita na ụfọdụ ụmụnna nọ na Jọpa so ha gawa Sizaria.

Mgbe ha ruru, Kọnịliọs hụrụ Pita, sekpuru ala n’ihu ya. Ma Pita sịrị ya: ‘Bilie. Abụ m mmadụ ibe gị. Chineke gwara m ka m bịa n’ụlọ gị, n’agbanyeghị na ndị Juu anaghị aga n’ụlọ ndị Jentaịl. Ugbu a, biko, gwa m ihe mere i ji sị m bịa.’

Kọnịliọs gwara Pita, sị: ‘Abalị anọ gara aga m nọ na-ekpe ekpere, otu mmụọ ozi agwa m ka m zie ozi ka a kpọọ gị. Biko, kụziere anyị okwu Jehova.’ Pita kwuru, sị: ‘Amatala m na Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Ọ na-anabata onye ọ bụla chọrọ ife ya.’ Pita kụziiri ha ọtụtụ ihe gbasara Jizọs. Mmụọ nsọ dakwasịziri Kọnịliọs na ndị niile nọ ebe ahụ. E mekwara ha niile baptizim.

“Ná mba ọ bụla, [Chineke] na-anabata onye na-atụ egwu ya, nke na-emekwa ihe dị mma.”​—Ọrụ Ndịozi 10:35

Ajụjụ: Gịnị mere Pita ji jụ iri anụmanụ ndị na-adịghị ọcha? Gịnị mere Jehova ji gwa Pita ka ọ gaa n’ụlọ onye Jentaịl?

Ọrụ Ndịozi 10:1-48

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya