IGBE 9E
‘Oge A Ga-eme Ka Ihe Niile Dị Ọhụrụ’
ỌRỤ 3:21
Mgbe Pita onyeozi kwuru banyere ‘oge a ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ,’ ọ bụ amụma ka ọ na-ebu gbasara oge ga-amagbu onwe ya, nke ga-amalite mgbe a ga-echi Kraịst Eze ruo ná ngwụcha otu puku afọ ọ ga-achị.
1914—E chiri Jizọs Kraịst Eze n’eluigwe. E mere ka ndị Chineke maliteghachi ife ya ezigbo ofufe n’afọ 1919
Oge Ikpeazụ
AMAGEDỌN—Ọchịchị Otu Puku Afọ Kraịst ga-amalite, a ga-agọzikwa ndị ji obi ha niile na-efe Chineke n’ụwa ‘n’oge a ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ’
Ọchịchị Otu Puku Afọ
NGWỤCHA OTU PUKU AFỌ—Jizọs ga-arụcha ọrụ ime ka ihe niile dị ọhụrụ ma nyefee Alaeze n’aka Nna ya
Paradaịs Ebighị Ebi
ỌCHỊCHỊ JIZỌS GA-EME KA . . .
e too aha Chineke
ndị mmadụ kwụsị ịrịa ọrịa
ndị agadi bụrụ okoro na agbọghọ
ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie
ndị na-efe Chineke zuo okè
ụwa bụrụ paradaịs