Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lff isi 45
  • Ihe Ịdị Iche n’Ụwa Pụtara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ịdị Iche n’Ụwa Pụtara
  • Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MỤTAKWUO IHE
  • NCHỊKỌTA
  • IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
  • Etinyela Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị n’Ụwa A Na-adịghị n’Otu
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • “Ha Abụghị Akụkụ nke Ụwa”
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Ndị Kraịst Bụ́ Ndị Na-anọpụ Iche n’Ụbọchị Ikpeazụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Gịnị Mere Ịnọpụ Iche Ji Dị Ezigbo Mkpa? (Maị. 4:2)
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
lff isi 45
Isi nke 45. Ebe otu nwanna nwaanyị na-eto eto guzo ọtọ mgbe ụmụ akwụkwọ ibe ya na-ekwe ukwe e ji eto mba, ma o soghị ha na-ekwe ya ma ọ bụ soro ha tụkwasị aka n’obi ya.

ISI NKE 45

Ihe Ịdị Iche n’Ụwa Pụtara

Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi

Jizọs sịrị na ndị na-eso ụzọ ya “abụghị nke ụwa.” (Jọn 15:19) Otu n’ime ihe ọ pụtara bụ na ha ekwesịghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa ma ọ bụ n’agha. N’eziokwu, ime ihe a anaghị adịcha mfe mgbe niile. O nwere ike ime ka ndị mmadụ jiri anyị na-eme ihe ọchị. Olee otú anyị ga-esi rubere Jehova Chineke isi ma gosi na anyị dị iche n’ụwa?

1. Olee otú ezigbo Ndị Kraịst si ele ndị ọchịchị anya?

Ndị Kraịst na-akwanyere ndị ọchịchị ùgwù. Anyị na-eme ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Kwụọnụ Siza ihe Siza.” Ọ pụtara na anyị ga na-erubere iwu obodo anyị isi, dị ka iwu nke kwuru ka anyị na-atụ ụtụ isi anyị. (Mak 12:17) Baịbụl kwuru na ihe mere ụmụ mmadụ ji na-achị bụ maka na Jehova hapụrụ ha. (Ndị Rom 13:1) Ihe a na-egosi na o nwere ebe ike ndị ọchịchị ruru kwụsị, ya bụ, ọ bụghị ihe niile ka ha nwere ike ime. Anyị na-atụ anya na oge na-abịa mgbe Chineke anyị ga-eji Alaeze ya dị n’eluigwe kwụsị nsogbu niile na-echi ụmụ mmadụ ọnụ n’ala.

2. Olee otú anyị ga-esi na-egosi na anyị dị iche n’ụwa?

Dị ka Jizọs, anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbe ndị mmadụ chọrọ ime Jizọs eze ha n’ihi ọrụ ebube ha hụrụ ọ rụrụ, o kweghị. (Jọn 6:15) Maka gịnị? Ọ bụ maka ihe o mechara kwuo. Ọ sịrị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.” (Jọn 18:36) E nwere ụzọ dị iche iche anyị bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs si egosi na anyị dị iche n’ụwa. Dị ka ihe atụ, anyị anaghị aga agha. (Gụọ Maịka 4:3.) Anyị na-akwanyere ihe ndị na-anọchi anya obodo, dị ka ọkọlọtọ, ùgwù, mana anyị anaghị efe ha ofufe. (1 Jọn 5:21) E nweghị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị anyị na-akwado, e nweghịkwa onye na-azọ ọkwá anyị na-akwado. Ụzọ ndị a bụ ụfọdụ n’ime ụzọ anyị si egosi na ọ bụ naanị ọchịchị Chineke, ya bụ, Alaeze Chineke, ka anyị na-akwado.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta oge ụfọdụ ime ihe ga-egosi na anyị dị iche n’ụwa nwere ike isiri anyị ike. Chọpụtakwa ihe ị ga-eme ga-eme Jehova obi ụtọ.

Ebe otu nwoke na-esoghị na-eme ihe ndị mmadụ na-eme, nke gosiri na ọ dị iche n’ụwa. Uche ya adịghị n’ihe mmadụ abụọ na-azọ ọchịchị na-agwa ìgwè mmadụ.

3. Ezigbo Ndị Kraịst dị iche n’ụwa

Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya gosiri anyị ihe anyị kwesịrị ime. Gụọnụ Ndị Rom 13:1, 5-7 na 1 Pita 2:13, 14. Unu gụchaa ha, unu akpọnye VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

VIDIO: Ezigbo Ndị Kraịst Dị Iche n’Ụwa​—Nke 1 (4:28)

  • Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-akwanyere ndị ọchịchị ùgwù?

  • Olee ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi gosi na anyị na-erubere ha isi?

Obodo abụọ lụwa agha, ụfọdụ mba nwere ike ịna-ekwu na o nweghị ndị nke ha na-adụnyere úkwù, ma ha na-akwadocha obodo abụọ ahụ. Oleezi ihe ịdị iche pụtara n’eziokwu? Gụọnụ Jọn 17:16. Unu gụchaa ya, unu akpọnye VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

VIDEO: Ezigbo Ndị Kraịst Dị Iche n’Ụwa​—Nke 2 (3:11)

  • Gịnị ka ịdị iche n’ụwa pụtara?

Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị agwa anyị mee ihe iwu Chineke sịrị anyị emela? Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 5:28, 29. Unu gụchaa ya, unu akpọnye VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

VIDIO: Ezigbo Ndị Kraịst Dị Iche n’Ụwa​—Nke 3 (1:18)

  • Ọ bụrụ na ndị ọchịchị enye iwu dị iche n’iwu Chineke nyere, olee iwu nke anyị kwesịrị idebe?

  • Ì nwere ike icheta otu ihe Ndị Kraịst na-agaghị ekwe eme ma ndị ọchịchị gwa ha mee ya?

4. Ka ihe ị na-eche na omume gị gosi na ị dị iche n’ụwa

Gụọnụ 1 Jọn 5:21. Unu gụchaa ya, unu akpọnye VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

VIDEO: Ihe Mere Ezigbo Ndị Kraịst Ji Kwesị Inwe Obi Ike​—Ịdị Iche n’Ụwa (2:49)

  • Na vidio a anyị lere, gịnị mere Ayenge ekweghị abanye n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ soro na-eme ememme e ji eto mba, dị ka igbuchapụrụ ọkọlọtọ?

  • Ì chere na ihe a o mere dị mma?

Olee ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka ịdị iche n’ụwa siere anyị ike? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

VIDIO: Ihe M Mụtara n’Isiokwu Ụlọ Nche Bụ́, Etinyela Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị n’Ụwa A Na-adịghị n’Otu (5:16)

  • Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị dị iche n’ụwa ma a bịa n’ihe gbasara asọmpi egwuregwu ndị si ebe dị iche iche n’ụwa na-eme?

  • Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị dị iche n’ụwa ọ bụrụgodị na ndị ọchịchị mere ihe baara anyị uru ma ọ bụ ihe kpataara anyị nsogbu?

  • Olee otú ụdị akụkọ ụwa anyị na-ege ma ọ bụ ndị anyị na ha na-akpa nwere ike isi mee ka o siere anyị ike ịna-adị iche n’ụwa?

Foto dị iche iche na-egosi: 1. Ebe ndị mmadụ jicha bọdụ e dere ihe na-eme ngagharị iwe. 2. Ebe otu nwoke ji ọkọlọtọ n’aka na-eto ndị òtù ya n’oge asọmpi egwuregwu. 3. Ebe otu nwa akwụkwọ na-ekwe ukwe e ji eto mba. 4. Ebe otu onye agha bụ égbè. 5. Ebe mmadụ abụọ na-azọ ọchịchị na-ekwu ka a tụnyere ha. 6. Ebe otu nwaanyị na-atụba akwụkwọ o ji tụọ vootu n’igbe.

Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị Onye Kraịst ga-esi n’ihe ọ na-eche na n’omume ya gosi na aka ya adịghị na ha?

MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe mere ị naghị egbuchapụrụ ọkọlọtọ ma ọ bụ ihe mere ị naghị ekwe ukwe e ji eto mba.

  • Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?

NCHỊKỌTA

Ndị Kraịst na-agbasi mbọ ike ka ha ghara itinye aka n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma n’echiche ha ma n’okwu ha ma n’omume ha.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee ụgwọ anyị ji ndị ọchịchị?

  • Gịnị mere anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?

  • Olee ihe ndị nwere ike ime ka o siere anyị ike ịdị iche n’ụwa?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Olee ihe ụfọdụ anyị ga-agba mbọ hapụ ka anyị nwee ike ịdị iche n’ụwa?

Jehova Akwụsịtụbeghị Inyere Anyị Aka (3:14)

Gịnị ka ezinụlọ dị iche iche nwere ike ime iji jikere maka oge ndị o nwere ike isiri ha ike igosi na ha dị iche n’ụwa?

Nọgide Na-anọpụ Iche n’Ihe Omume E Ji Eto Mba (4:25)

Gịnị mere na mmadụ ịlụrụ obodo ya agha abụghị ihe kacha eme ka a na-akwanyere mmadụ ùgwù?

“Ihe Niile Kwere Omume n’Ebe Chineke Nọ” (5:19)

Mgbe anyị na-ekpebi ụdị ọrụ anyị ga-arụ, chọpụta otú anyị ga-esi egosi na anyị dị iche n’ụwa.

“Onye Ọ Bụla Ga-ebu Ibu nke Ya” (Ụlọ Nche, Mach 15, 2006)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya