Ihe Ndị Mere n’Oge Baịbụl—Ndị Egwú na Ngwá Egwú Ha
“Jirinụ ịfụ opi too [Chineke]. Jirinụ ụbọ akwara na une too ya. Jirinụ obere ịgbà na egwú a na-ete na-agba gburugburu too ya. Jirinụ ụbọ akwara na ọjà too ya. Jirinụ ájà nke nwere ụda dị ụtọ too ya. Jirinụ ájà nke na-ada ụda too ya.”—ABỤ ỌMA 150:3-5.
KEMGBE ụwa, a na-eji egwú efe Jehova Chineke, ndị na-akụ egwú arụọkwala ọrụ dị mkpa n’ofufe Chineke. Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova kewara Oké Osimiri Uhie, ndị Izrel esi n’etiti ya gafere, Miriam, bụ́ nwanne Mozis, bidoro gụwa egwú ma na-agba ya agba, ụmụ nwaanyị ndị ọzọ esorokwa ya. Ụmụ nwaanyị ahụ na-akụkwa obere ịgbà mgbe ha na-agba egwú a. Ihe a merenụ gosiri na ndị Izrel ji egwú kpọrọ ihe. N’agbanyeghị na ọ dịbeghị anya ha gbara ọsọ ndụ n’ihi ndị agha Ijipt, ọtụtụ n’ime ụmụ nwaanyị ahụ atụfughị ngwá egwú ha. (Ọpụpụ 15:20) Eze Devid mechara họpụta ọtụtụ puku mmadụ ndị ga na-eji ngwá egwú dị iche iche enye Chineke otuto n’ụlọ nsọ Sọlọmọn nwa ya rụrụ.—1 Ihe E Mere 23:5.
Gịnị ka e ji rụọ ngwá egwú ndị ahụ? Olee otú ha na-adị? Olee otú ha si ada? Oleekwa mgbe a na-eji ha akụ egwú?
Ngwá Egwú Ndị E Nwere n’Oge Ochie
Ihe ndị e ji mee ngwá egwú ndị e kwuru okwu ha na Baịbụl bụ ezigbo osisi, akpụkpọ anụ, ígwè, na mpi anụ. A na-eji ọdụ́ enyí amachi ụfọdụ n’ime ha. Ebe e si enweta akwara e ji ekwe ụbọ bụ n’osisi ma ọ bụ n’eriri afọ anụ. Ọ bụ eziokwu na ngwá egwú ndị ahụ e nwere n’oge ochie adịghịzi taa, a ka nwere foto ha.
E nwere ike ikwu na ngwá egwú ndị e ji kụọ egwú n’oge Baịbụl dị ụzọ atọ. E nwere ndị nke a na-akpọ akpọ, dị ka ụbọ akwara (1), na une (2); na ndị nke a na-afụ afụ, dị ka mpi anụ (3), opì (4), ọjà (5); nakwa ndị nke a na-akụ akụ, dị ka obere ịgbà (6), sistrọm (7), ájà (8), na mgbịrịgba (9). Ndị egwú na-akụ ngwá egwú ndị a mgbe a na-abụ abụ, mgbe a na-agụ egwú, ma ọ bụ mgbe a na-agba egwú. (1 Samuel 18:6, 7) Nke ka nke bụ na ha na-eji ngwá egwú ndị a efe Chineke, bụ́ onye nyere ha amamihe ha ji akụ egwú. (1 Ihe E Mere 15:16) Ka anyị lebakwuo anya ná ngwá egwú ndị ahụ.
Ndị nke A Na-akpọ Akpọ Otú e si arụ ụbọ akwara bụ na a na-ekwe akwara ya n’osisi. Ụbọ akwara anaghị adị arọ, ọ dịkwa mfe iji ya n’aka agagharị agagharị. Devid kpọọrọ Eze Sọl ụbọ akwara ka obi wee dị ya mma. (1 Samuel 16:23) A kpọrọ ụbọ akwara mgbe e mere ememme e ji nyefee Jehova ụlọ nsọ ahụ Sọlọmọn rụrụ, a kpọkwara ya n’ememme ndị ọzọ ụmụ Izrel mere.—2 Ihe E Mere 5:12; 9:11.
Une na ụbọ akwara yitụrụ, ma ha abụọ ahaghị. Otú e si arụ une bụ na a na-ewere akwara ole na ole kwee n’osisi ime ya ghere oghe. Ụda a na-anụ ma a kpaa akwara ndị ahụ aka na-atọ ụtọ, o nwekwara ike ịbụ na ụda ha na-adị ka ụda ụbọ akwara ndị e nwere n’oge a. Ọ bụ n’osisi ma ọ bụ n’eriri afọ anụ ka e si enweta akwara e ji ekwe une.
Ndị nke A Na-afụ Afụ N’ọtụtụ ebe na Baịbụl, e kwuru banyere ngwá egwú ndị nke a na-afụ afụ. Nke so ná ndị kacha ochie n’ime ha bụ mpi ebule. Ndị Juu na-eji ya afụ opi. Mpi a na-enwe oghere n’ime, ọ na-adasikwa ụda ike ma a fụọ ya. Ndị Izrel na-eji mpi ebule a akpọkọta ndị agha maka agha, na-ejikwa ya agwa ndị obodo ihe ha ga-eme.—Ndị Ikpe 3:27; 7:22.
Ngwá egwú ọzọ a na-afụ afụ bụ opì e ji ígwè rụọ. Otu akwụkwọ so ná mpịakọta akwụkwọ ndị a hụrụ n’akụkụ Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ gosiri na e nwere ụda dị iche iche ndị na-akụ egwú nwere ike iji opi a fụọ. Jehova gwara Mozis ka o mee opì ọlaọcha abụọ a ga na-afụ n’ụlọikwuu Jehova. (Ọnụ Ọgụgụ 10:2-7) Mgbe a na-eme ememme e ji nyefee Jehova ụlọ nsọ ahụ Sọlọmọn rụrụ, otu narị mmadụ na iri abụọ fụrụ opì dara ezigbo ụda n’ememme ahụ. (2 Ihe E Mere 5:12, 13) Ndị na-arụ opì na-arụ opì dị iche iche, ma ndị dị mkpụmkpụ ma ndị dị ogologo. E nwedịrị opi ndị karịrị sentimita iri itoolu na otu n’ogologo, malite n’ebe e si afụ ya ruo n’ọnụ ọnụ ya.
Otu n’ime ngwá egwú ndị Izrel na-afụkarị bụ ọjà. Ọ na-atọ ndị mmadụ ezigbo ụtọ ịnụ ka a na-egbu ọjà n’oge a na-eme oriri ma ọ bụ mgbe a na-agba akwụkwọ ma ọ bụkwanụ mgbe ndị ezinụlọ zukọtara. (1 Ndị Eze 1:40; Aịzaya 30:29) A na-egbukwa ọjà n’ebe a na-eli ozu, bụ́ mgbe ndị egwú na-agụ egwú e ji eru uju (gụọ peeji nke 14).—Matiu 9:23.
Ndị nke A Na-akụ Akụ Mgbe ụmụ Izrel na-eme ememme, ha na-akụ ụdị ngwá egwú dị iche iche a na-akụ akụ. Ụda ngwá egwú ndị a na-eru ndị mmadụ n’obi. Otu n’ime ha bụ obere ịgbà. Otú e si arụ obere ịgbà bụ na a na-eji akpụkpọ anụ ekwechi osisi ghere ọnụ nke dị okirikiri ma tinyechaa obere mgbịrịgba n’akụkụ ya. A na-ekwechi naanị otu akụkụ ma hapụ akụkụ ya nke ọzọ. Mgbe onye na-akụ egwú ma ọ bụ onye na-agba egwú ji aka na-akụ n’obere ịgbà ahụ, mgbịrịgba ndị ahụ na-ayọgharị ayọgharị.
Ngwá egwú ọzọ a na-akụ akụ bụ sistrọm. A na-eji ígwè arụ ya, a na-arụkwa ya otú ọ ga-enwe ebe a ga na-ejide ya aka. A na-eji okporo ígwè ole na ole, ndị e konyechara obere ígwè, atụhie ebe etiti ya. Ọ bụrụ na a yọgharịa sistrọm a, ụda ya na-adị ka ụda mgbịrịgba.
E nwere ngwá egwú ọzọ a na-akụ akụ nke a na-akpọ ájà. Ọ na-adasi ụda ike karịa sistrọm. A na-eji ọla nchara arụ ya. Ájà na-adị mbadamba ka efere, ọ na-adịkwa abụọ abụọ. E nwere ndị nke obere, nweekwa ndị nke nnukwu. A na-ejide ndị nke nnukwu n’aka, otu n’aka nri, nke ọzọ n’aka ekpe, ma kụkọta ha abụọ ọnụ, ha adaa oké ụda. Ma a na-ekonye ndị nke obere ná mkpịsị aka abụọ mgbe a na-akụ ha, ụda ha na-atọkwa ụtọ. Ndị nke obere anaghị adasi ụda ike ka ndị nke nnukwu, ma ụda ha abụọ, ya bụ, ụda ndị nke nnukwu na ndị nke obere, na-adị ka ebe a kụkọtara efere gbamgbam abụọ ọnụ.—Abụ Ọma 150:5.
Ndịàmà Jehova Na-eme Ka Ndị Fere Chineke n’Oge Ochie
Taa, Ndịàmà Jehova na-eji abụ amalite ọmụmụ Baịbụl ha n’ebe ha na-amụ ihe, jirikwa abụ emechi ya. Ná mgbakọ ukwu ha, a na-akpọ abụ ndị e ji ngwá egwú ọgbara ọhụrụ dị iche iche kụọ, ya bụ, ngwá egwú ndị nke a na-akpọ akpọ, ndị nke a na-afụ afụ, ndị nke a na-akụ akụ, na ụdị ngwá egwú ndị ọzọ.
Ndịàmà Jehova na-eme ka ndị Izrel oge ochie na Ndị Kraịst oge mbụ n’ihi na ha na-eji abụ na egwú efe Chineke. (Ndị Efesọs 5:19) Ọ na-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ n’oge a iji abụ e dere ede na nke a kụrụ akụ eto Jehova otú ahụ ndị fere Chineke n’oge ochie mere.
[Igbe ndị dị na peeji nke 23]
(Ọ bụghị otú a ka ngwá egwú ndị a na-aha)
(Lee ebe e sere ya n’akwụkwọ a)