Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 5/1 p. 14
  • Jehova Ọ̀ Hụrụ Gị n’Anya n’Eziokwu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Ọ̀ Hụrụ Gị n’Anya n’Eziokwu?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Na-eche Banyere Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • È Nwere Onye Na-eche Banyere M?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • ‘Jehova, Ị Maara M’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Nweta Obi nke Dị Ka Jehova Si Chọọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 5/1 p. 14

BỊARUO CHINEKE NSO

Jehova Ọ̀ Hụrụ Gị n’Anya n’Eziokwu?

E nwere otu nwaanyị nke o siiri ike ikweta na Jehova nwere ike ịhụ ya n’anya. Nwaanyị ahụ sịrị: “Ihe kacha mee ka o siere m ike ịbụ enyi Jehova bụ na m na-eche na o nweghị uru m bara.” Ò nwere mgbe ọ na-adị gị otú ọ dị nwaanyị a? Ọ bụrụ otú ahụ, i nwere ike ịna-ajụ onwe gị ma ‘Jehova ọ̀ hụrụ onye nke ọ bụla n’ime ndị na-efe ya n’anya.’ Azịza ya bụ ee. Ihe Jizọs kwuru na-egosi na Jehova ejighị onye nke ọ bụla n’ime ha egwuri egwu.—Gụọ Jọn 6:44.

N’eziokwu, Jizọs maruru Jehova ala karịa onye ọ bụla ọzọ. Gịnị ka o kwuru banyere Jehova? (Luk 10:22) Ọ sịrị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m, bụ́ onye zitere m, adọtaghị ya.” Nke a na-egosi na anyị agaghị abụli ndị na-eso ụzọ Kraịst ma na-efekwa Jehova ọ gwụla ma Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova ọ̀ dọtara anyị n’ebe ọ nọ. (2 Ndị Tesalonaịka 2:13) Ọ bụrụ na anyị aghọta ihe a Jizọs kwuru, anyị ga-ahụ na ihe a o kwuru na-egosi n’eziokwu na Chineke hụrụ ndị na-efe ya n’anya n’otu n’otu.

Mgbe Jizọs kwuru na Jehova na-adọta anyị, gịnị ka o bu n’obi? Okwu Grik a sụgharịrị ‘dọta’ bụkwa ya ka e dere n’ebe ndị e kwuru banyere isi na mmiri dọpụta ụgbụ azụ̀ juru na ya. (Jọn 21:6, 11) Nke a ọ̀ pụtara na Jehova na-adọta anyị ka anyị fewe ya ma ànyị chọrọ ma ọ bụ na anyị achọghị? Ọ bụghị ihe ọ pụtara. Jehova chọrọ ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme. N’ihi ya, ọ naghị amanye anyị amanye ka anyị megheere ya obi anyị. (Diuterọnọmi 30:19, 20) Otu ọkà mmụta kwuru, sị: “Obi mmadụ dị ka ọnụ ụzọ na-enweghị onye ọzọ ga-emegheli ya. Ọ bụ naanị onye nwe ya ga-emegheli ya.” Jehova na-enyocha obi ọtụtụ ijeri mmadụ nọ n’ụwa, na-achọ ma ọ̀ ga-ahụ ndị chọrọ ife ya. (1 Ihe E Mere 28:9) Ọ bụrụ na e nwee onye nke Jehova hụrụ, Jehova na-eme otu ihe magburu onwe ya. Gịnị bụ ihe ahụ ọ na-eme?

Jehova na-eji nwayọọ adọta onye ahụ “nwere ezi obi.” (Ọrụ Ndịozi 13:48) E nwere ụzọ ihe abụọ Jehova na-eji eme ya. Otu bụ ozi ọma si na Baịbụl nke ọ na-eme ka onye ahụ nụ. Nke abụọ abụrụ mmụọ nsọ ya. Mgbe Jehova hụrụ na onye ahụ ji obi ya nabata eziokwu ọ na-amụta na Baịbụl, ọ na-ejizi mmụọ nsọ ya enyere onye ahụ aka ka ọ ghọta ihe ọ na-amụ ma na-eme ya eme. (1 Ndị Kọrịnt 2:11, 12) Anyị emekataghị bụrụ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs ma na-efe Jehova otú ọ chọrọ ọ gwụla ma Jehova o nyeere anyị aka.

“Obi mmadụ dị ka ọnụ ụzọ na-enweghị onye ọzọ ga-emegheli ya. Ọ bụ naanị onye nwe ya ga-emegheli ya”

Gịnịzi ka okwu Jizọs ahụ e dere na Jọn 6:44 na-akụziri anyị banyere Jehova Chineke? Ọ na-akụziri anyị na Jehova na-adọta ndị mmadụ n’ebe ọ nọ n’ihi na ọ hụrụ ezi ihe n’obi ha ma hụkwa ha n’anya n’otu n’otu. Ọ bụ ihe a ka nwaanyị ahụ e kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a mechara ghọta, obi eruo ya ala. O kwuru, sị: “Mmadụ ịbụ onye na-efe Jehova bụ ihe ọma kachanụ nwere ike imere mmadụ. Ọ bụrụ na Jehova họọrọ m ka m fewe ya, ọ pụtara na m bara ezigbo uru n’anya ya.” Gịnwakwanụ? Ugbu a ị matara na Jehova hụrụ ndị na-efe ya n’anya n’otu n’otu, ị́ gaghị achọ imeghere ya obi gị?

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Mee:

Luk 22-24–Jọn 1-16

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya