Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 9/15 p. 3-6
  • Otú Ihe Abụọ Dị Iche Nwere Ike Isi Baara Gị Uru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ihe Abụọ Dị Iche Nwere Ike Isi Baara Gị Uru
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OTÚ Ọ GA-ESI BAARA GỊ URU
  • Zụlite Ikike Gị Dị Ka Onye Ozizi
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • “Na-ejegharịnụ Dị Ka Ụmụ Nke Ìhè”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Jehova Na-achịkọta Ezinụlọ Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • “Jee Ozi Gị N’ụzọ Zuru Ezu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 9/15 p. 3-6

Otú Ihe Abụọ Dị Iche Nwere Ike Isi Baara Gị Uru

O doro anya na ọ bụ Jizọs bụ onye kachanụ ná ndị niile kụzitụrụla ihe n’ụwa. Mgbe ọ nọ n’ụwa, o ji ihe atụ na ajụjụ kụziere ndị mmadụ ihe. O nwere ike ịbụ na ị gbalịala ka ị kụziere ndị mmadụ ihe otú ahụ Jizọs si kụzie. Ma, ị̀ ma na mgbe ụfọdụ, Jizọs na-eji ihe abụọ dị iche eme ka a ghọta ihe ọ na-ekwu?

Ọtụtụ ndị na-eme ụdị ihe ahụ Jizọs mere. Gịnwa nwedịrị ike ịna-eme ya ma ị maghị na ọ bụ ihe ị na-eme. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịsị: “A sịrị na mkpụrụ osisi a niile chara acha. Ma, ndị nke a achabeghị.” I nwekwara ike ịsị: “O nwere mgbe nwata nwaanyị a bụ onye ihere. Ma, ọ naghịzi eme ihere.”

Mgbe a na-ekwu ihe abụọ dị iche, a na-ebu ụzọ kwuo otu ihe, kwuzie ma, kama, ma ọ bụ otú ọ dị tupu e kwuo nke abụọ. E nwekwara ike ikwu ihe ọzọ dị iche ga-eme ka a ghọta ihe nke abụọ a chọrọ ikwu. Ọ bụrụ na e kwuo okwu otú a, ndị mmadụ ga-aghọta ihe e kwuru n’ihi na e kwuru ya otú e si ekwu ya.

Ọ bụrụgodị na a naghị eji ihe abụọ dị iche eme ka a ghọta ihe a na-ekwu n’asụsụ ụfọdụ, anyị kwesịrị ịghọta na isi otú ahụ ekwu okwu na-aba uru. Ọ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na o juru eju n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ na-ejikarị ihe abụọ dị iche eme ka a ghọta ihe ọ na-ekwu. Dị ka ihe atụ, o kwuru, sị: “Ndị mmadụ na-amụnye oriọna ma dọba ya, ọ bụghị n’okpuru nkata, kama n’elu ihe ndọba oriọna.” “M bịara, ọ bụghị ibibi [Iwu], kama imezu ya.” “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Akwala iko.’ Ma ana m asị unu na onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya . . . ” “A sịrị, ‘Anya laara anya, ezé laakwara ezé.’ Otú ọ dị, ana m asị unu: Emegwarala onye bụ́ ajọ mmadụ ihe o mere gị; kama onye ọ bụla nke mara gị ụra na ntì aka nri, tụgharịkwaara ya nke ọzọ.”—Mat. 5:15, 17, 27, 28, 38, 39.

E nwekwara ebe ndị ọzọ e kwuru ihe abụọ dị iche na Baịbụl. Ha nwere ike ime ka anyị ghọta ihe a na-ekwu ma ọ bụkwanụ otú ihe nke abụọ e kwuru si ka ihe nke mbụ e kwuru mma. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, chebara ihe a Pọl kwuru echiche. Ọ sịrị: “Unu ndị bụ́ nna, unu emela ụmụ unu ihe iwe, kama na-azụlitenụ ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” (Efe. 6:4) A sị na naanị ihe Pọl kwuru bụ na nna ma ọ bụ nne kwesịrị ịzụlite ụmụ ya n’ọzụzụ si n’aka Chineke, o nweghị onye ga-asị na ihe o kwuru adịghị mma. Ma, ihe ọzọ o kwuru mere ka ihe ọ na-ekwu dokwuo anya. Ọ sịrị: ‘Unu emela ụmụ unu ihe iwe, kama na-azụlitenụ ha ná nduzi echiche nke si n’aka Jehova.’

Pọl mechara dee ná Ndị Efesọs 6:12, sị: “Anyị nwere mgba, ọ bụghị megide ọbara na anụ ahụ́, kama megide . . . ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.” Ihe abụọ a Pọl kwuru nwere ike ime ka anyị ghọta na mgba anyị na-agba siri ike. Ọ bụghị ndị mmadụ ka anyị na ha na-agba mgba, kama ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ.

OTÚ Ọ GA-ESI BAARA GỊ URU

N’akwụkwọ Ndị Efesọs, e nwere ebe ndị ọzọ Pọl ji ihe abụọ dị iche mee ka a ghọtakwuo ihe ọ na-ekwu. Ọ bụrụ na anyị echebara ihe ndị ahụ echiche, o nwere ike ime ka anyị ghọtakwuo ihe Pọl na-ekwu, meekwa ka ihe anyị kwesịrị ime dokwuo anyị anya.

Na chaatị dị na peeji nke anọ na nke ise, ị ga-ahụ ebe dị iche iche Pọl ji ihe abụọ dị iche mee ka a ghọta ihe ọ na-ekwu ná Ndị Efesọs isi nke anọ na nke ise. Ọ bụrụ na i chebara ebe ndị ahụ echiche, ọ ga-abara gị uru. Ka ị na-agụ nke ọ bụla, chebara onwe gị echiche. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú m si ele ihe anya? Gịnị ka m na-eme ma ụdị ihe a mee? N’ime ihe ndị ahụ Pọl kwuru, olee nke ndị mmadụ ga-asị na m na-eme? Ọ̀ bụ ndị ahụ dị n’aka ekpe, ka ọ̀ bụ ndị dị n’aka nri?’ Ọ bụrụ na ị chọpụta na n’ime ihe ndị ahụ Pọl kwuru, e nwere nke mere ka ị mata àgwà i kwesịrị ịgbanwe, gbaa mbọ gbanwee ya. I mee otú ahụ, ihe ahụ o kwuru ga-abara gị uru.

Gị na ezinụlọ gị nwekwara ike iji ihe ndị dị na chaatị ahụ nwee ofufe ezinụlọ. Unu niile nwere ike ibu ụzọ gụọ ha. Otu onye nwere ike ịgụpụta otu n’ime ihe ndị ahụ e dere n’aka ekpe, ndị nke ọzọ elee ma hà ga-echeta ihe e kwuru n’aka nri. Ọ ga-eme ka ofufe ezinụlọ unu tọọ unu ụtọ, unu amata otú unu nwere ike isi mee ihe ndị ahụ e kwuru n’aka nri. Ọ bụrụ na unu esi otú ahụ tụlee ihe ndị ahụ e kwuru na chaatị ahụ, o nwere ike ime ka onye ukwu na onye nta na-akpa àgwà otú Chineke chọrọ ma n’ụlọ ma n’ebe ndị ọzọ.

Ì nwere ike icheta ihe ndị e kwuru n’aka nri na chaatị a?

Ka ị na-aghọtakwu uru iji ihe abụọ dị iche akụzi ihe bara, i nwere ike ịna-amatakwu ha mgbe ọ bụla ị hụrụ ha na Baịbụl. I nwekwara ike ịghọta na ha ga-abara gị ezigbo uru n’ozi ọma. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịgwa onye ị chọrọ izi ozi ọma, sị: “Ọtụtụ ndị na-ekwu na anyị niile nwere mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ, ma lee ihe Okwu Chineke kwuru.” Mgbe gị na mmadụ na-amụ Baịbụl, i nwekwara ike ịjụ ya, sị: “Ọtụtụ ndị na-ekwu na Chineke na Jizọs bụ otu, ma, gịnị ka Baịbụl kwuru? Gịnị ka gịnwa chere?”

Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ ebe Baịbụl kwuru ihe abụọ dị iche ga-enyere anyị aka ịghọta ihe a na-ekwu na ime uche Chineke. Anyị nwekwara ike iji ha nyere ndị ọzọ aka ka ha ghọta Baịbụl nke ọma.

Ebe Ụfọdụ Pọl Ji Ihe Abụọ Dị Iche Mee Ka A Ghọta Ihe Ọ Na-ekwu ná Ndị Efesọs Isi nke Anọ na nke Ise

Gị na ezinụlọ gị gbalịa jiri ihe ndị dị na chaatị a nwee ofufe ezinụlọ

“Ka anyị wee ghara ịbụkwa . . . ndị ifufe ozizi ọ bụla na-ebugharị, site n’aghụghọ nke ụmụ mmadụ, site ná njehie e ji aghụghọ chepụta.”​—4:14.

“Kama n’ikwu eziokwu, ka anyị site n’ịhụnanya tolite n’ihe niile n’ime onye ahụ bụ́ isi, ya bụ, Kraịst.”​—4:15.

“[Ndị mba ọzọ] nọ n’ọchịchịrị n’uche, . . . n’ihi amaghị ihe nke dị n’ime ha.”​—4:18, 19.

“Ma unu amụtaghị Kraịst dị ka onye dị otú ahụ, ma ọ bụrụhaala na unu nụrụ ihe o kwuru ma bụrụ ndị e sitere n’aka ya zie ihe.”​—4:20, 21.

“Unu kwesịrị iyipụ mmadụ ochie ahụ, nke kwekọrọ n’ụzọ unu si eme omume n’oge gara aga.”​—4:22.

“Kama nke ahụ, unu kwesịrị ime ka ike nke na-eduzi uche unu dị ọhụrụ, unu kwesịkwara iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ.”​—4:23, 24.

“Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi.”​—4:28.

“Kama ka ọ rụsie ọrụ ike, jiri aka ya na-arụ ọrụ ọma.”​—4:28.

“Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta.”—4:29.

“Kama nke ahụ, ka ọ bụrụ okwu dị mma maka iwuli elu.”​—4:29.

“Wepụnụ obi ilu niile na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị, tinyere ihe ọjọọ niile, n’etiti unu.”​—4:31.

“Ma nweenụ obiọma n’ebe ibe unu nọ, na-enwekwanụ obi ọmịiko, na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam.”​—4:32.

“Ka a ghara ịkpọtụdị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu aha n’etiti unu.”​—5:3.

“Kama nke ahụ ikele Chineke.”​—5:4.

“Unu bụbu ọchịchịrị.”​—5:8.

“Ma ugbu a unu bụ ìhè n’ime Onyenwe anyị.”​—5:8.

“Kwụsịkwanụ iso ha na-ekere òkè n’ọrụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ bụ́ ndị dịịrị ọchịchịrị.”​—5:11.

“Ma, kama nke ahụ, ọbụna na-akatọnụ ha.”​—5:11.

“Ya mere, na-echesinụ nche ike ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe.”​—5:15.

“Kama dị ka ndị maara ihe, na-azụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị.”​—5:15, 16.

“N’ihi nke a, kwụsịnụ ịbụ ndị na-enweghị ezi uche.”​—5:17.

“Kama nọgidenụ na-aghọta ihe uche Jehova bụ.”​—5:17.

“Unu adịkwala na-aṅụbiga mmanya ókè, nke ndụ ịla n’iyi dị na ya.”​—5:18.

“Kama na-ejupụtanụ na mmụọ nsọ.”​—5:18.

“Ka [Kraịst] wee chee ọgbakọ ahụ n’ihu onwe ya n’ịma mma ya, n’enweghị ntụpọ ma ọ bụ ahụ́ ndọlị ma ọ bụ ihe ọ bụla dị otú ahụ.” ​—5:27.

“Kama ka o wee dị nsọ, gharakwa inwe mmerụ.”​—5:27.

“Ọ dịghị onye kpọtụworo anụ ahụ́ ya asị.”​—5:29.

“Kama ọ na-azụ ya, na-elekọtakwa ya, dị ka Kraịst na-emekwara ọgbakọ ya.”​—5:29.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya