Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 5/1 p. 9
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Daniel Nọ n’Olulu Ọdụm
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ọdụm—Nwamba Dị Ebube, Nwere Ọzà nke Africa
    Teta!—1999
  • Site ná Ndọrọ n’Agha Laa Babilọn Ruo ná Mwughachi nke Mgbidi Jeruselem
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • A Tụbara Daniel n’Olulu Ọdụm
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 5/1 p. 9

Ị̀ MAARA?

Ihe ndị e gwupụtara n’ala hà gosiri na ihe ndị e dere na Baịbụl bụ eziokwu?

Ebe a tụrụ Eze Sagọn nke abụọ n’okwute

Onye a bụ Eze Asiria aha ya bụ Sagọn nke abụọ e kwuru okwu ya n’Aịzaya 20:1

Otu isiokwu gbara n’akwụkwọ a na-akpọ Biblical Archaeology Review kwuru na e nwere, ‘ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, mmadụ iri ise’ a kpọrọ aha n’Agba Ochie aha ha dịkwa n’ihe ndị e gwupụtara n’ala. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị eze iri na anọ chịrị Juda na Izrel, ma ndị nke a na-anụ aha ha, dị ka Devid na Hezekaya, ma ndị nke a na-anaghị anụcha aha ha, dị ka Menahem na Pika. Ndị ọzọ sokwa ná ndị a hụrụ aha ha n’ihe ndị e gwupụtara n’ala bụ ndị eze ise chịrị Ijipt na ndị eze iri na itoolu chịrị Asiria, Babịlọn, Moab, Peshia, na Siria. Ma, ọ bụghị naanị ndị eze ka a hụrụ aha ha n’ihe ndị ahụ e gwupụtara n’ala. Ndị ọzọ a hụkwara aha ha bụ ndị isi nchụàjà, otu odeakwụkwọ, na ndị ọzọ nwere ọrụ pụrụ iche ha na-arụ.

Isiokwu ahụ gbara n’akwụkwọ ahụ anyị kwuburu okwu ya kwukwara na “ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ kweere” na ọ bụ ndị ahụ e kwuru okwu ha na Baịbụl bụ ndị ahụ aha ha dị n’ihe ndị ahụ e gwupụtara n’ala. E nwekwara ọtụtụ ndị ọzọ a kpọrọ aha n’Agba Ọhụrụ aha ha dịkwa n’ọtụtụ ihe ndị e gwupụtara n’ala. Ha bụ ndị dị ka Herọd, Pọntiọs Paịlet, Taịbiriọs, Keyafas, na Sajiọs Pọlọs.

Olee mgbe a kwụsịrị ịhụ ọdụm n’obodo ndị dị n’oge e dere Baịbụl?

Ebe e ji brik ndị na-egbuke egbuke tụọ ọdụm n’ahụ́ mgbidi

Ọdụm e ji ọmarịcha brik ndị na-egbuke egbuke tụọ n’ahụ́ mgbidi n’obodo Babịlọn

Ọ bụ eziokwu na o nweghịzi ọdụm dị n’Izrel taa, ma ndị dere Baịbụl kwuru okwu banyere ọdụm ihe dị ka otu narị ugboro na iri ise. O gosiri na ndị ahụ dere Baịbụl ma banyere ọdụm. N’ọtụtụ n’ime ebe ndị ahụ e kwuru okwu ọdụm na Baịbụl, ọ bụ ihe atụ ka e ji ha mee. Ma, o nwekwara ebe ụfọdụ e kwuru na Baịbụl gbasara ọdụm nkịtị. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na Samsịn, Devid, na Benaya gbuchara ọdụm. (Ndị Ikpe 14:​5, 6; 1 Samuel 17:​34, 35; 2 Samuel 23:20) O nwekwara ndị o kwuru ọdụm gburu.​—⁠1 Ndị Eze 13:24; 2 Ndị Eze 17:⁠25.

N’oge gboo, e nwere ọdụm ndị dị n’Eshia Maịnọ, Gris, Palestaịn, Siria, Mesopotemia, nakwa n’agbata ebe ugwu na ebe ọdịda anyanwụ India. A na-atụ ọdụm ndị a ezigbo ụjọ, na-akwanyekwara ha ezigbo ùgwù. Ndị na-ese ihe n’oge ahụ na-esekarịkwa ha n’ihe osise ha. N’obodo Babịlọn, e nwekwara ọdụm ndị e ji ọmarịcha brik ndị na-egbuke egbuke tụọ n’ahụ́ mgbidi ndị dị n’Okporo Ámá E Si Agafe n’Oge Ememme.

E kwukwara na ndị agha ndị Krisendọm chụrụ nta ọdụm na Palestaịn n’ihe dị ka n’agbata afọ 1160 na afọ 1200. Ma, obere oge afọ 1300 gachara, o yiri ka e nweghịzi ọdụm ka fọrọ ebe ahụ. Ma, ruo n’ihe dị ka n’afọ 1801, ndị ụfọdụ na-ekwu na ha ka na-ahụ ọdụm na Mesopotemia nakwa na Siria. Ruokwa n’ihe dị ka n’afọ 1901, o nwekwara ndị na-ekwu na ha ka na-ahụ ọdụm n’Ịran nakwa n’Ịrak.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya