Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 6/15 p. 18-19
  • “Ebe Ọ Bụ na Kingsley Mere Ya, M Ga-emeli Ya”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ebe Ọ Bụ na Kingsley Mere Ya, M Ga-emeli Ya”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ỊGA ỌMỤMỤ IHE NA ỊZA AJỤJỤ N’ỌMỤMỤ IHE
  • Gịnị Ka Mmadụ Ịbụ Onye Kraịst Pụtara?
    Teta!—2007
  • Ndeba Aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Otu Ụlọ Akwụkwọ Na-aga nke Ọma nke Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—1996
  • Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2001
    Ozi Alaeze Anyi—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 6/15 p. 18-19
Mgbe a na-eme Kingsley baptizim

“Ebe Ọ Bụ Na Kingsley Mere Ya, M Ga-emeli Ya”

E NWERE otu nwoke aha ya bụ Kingsley. N’ụbọchị mbụ o mere ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ọ malitere ịgụ Baịbụl ozugbo a kụtụrụ ya aka n’ubu. O ji nwayọọ na-akpọpụta okwu niile nke ọma. E nweghị nke ọ na-akpọtaghị. Ma, ọ naghị ele anya na Baịbụl. Maka gịnị?

Kingsley bi na Siri Lanka. O kpuru ìsì, bụrụ onye ntị ike, daakwa ngwọrọ. Olee otú nwoke a si mụta banyere Jehova? Oleekwa otú o si ruo eru ime ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke? Ka m kọọrọ gị.

Mgbe mbụ m hụrụ Kingsley, obi tọrọ m ụtọ n’ihi otú o si chọsie ike ịmata eziokwu Baịbụl. Ya na ụfọdụ Ndịàmà Jehova amụọla Baịbụl. O nwere akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì, ma o meela ochie.a O kwetara ka m malite ịmụrụ ya ihe. Ma, e nwere ihe abụọ mere ka o sitụrụ anyị ike.

Nke mbụ bụ na Kingsley na ọtụtụ ndị ọzọ bi n’ebe a na-elekọta ndị agadi na ndị nwere nkwarụ. M na-eti mkpu ka o wee nụ ihe m na-ekwu n’ihi na ọ bụ onye ntị ike, mkpọtụ na-adịkwa n’ebe ahụ. N’eziokwu, onye ọ bụla nọ n’ebe ahụ na-anụ ihe anyị na-amụ kwa izu.

Nke abụọ bụ na ọ bụ naanị ihe ole na ole ka Kingsley ga-agụli ma ghọta ma anyị mụwa ihe. N’ihi ya, Kingsley na-akwado nke ọma. Tupu mụ abịa, ọ na-agụ ebe anyị ga-amụ ọtụtụ ugboro, jirikwa Baịbụl ndị ìsì ya gụọ amaokwu Baịbụl ndị dị ebe ahụ, chepụtakwa otú ọ ga-esi zaa ajụjụ niile dị ebe ahụ. Otú a o si akwado baara anyị ezigbo uru. Anyị mụwa ihe, ọ na-agwọrọ na rọg a tụrụ n’ala. Ọ na-eti aka ya n’ala ma tisie mkpu ike ma ọ kọwawa ihe ọ mụtara. Ka oge na-aga, anyị malitere ịmụ ihe ugboro abụọ n’izu. Ọmụmụ ihe nke ọ bụla na-ewekwa anyị awa abụọ.

ỊGA ỌMỤMỤ IHE NA ỊZA AJỤJỤ N’ỌMỤMỤ IHE

Kingsley na Paul

Kingsley na Paul

Ọ na-agụsi Kingsley ike ịga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma ọ dịghị mfe. A ga-ekunye ya n’oche ndị ngwọrọ, kupụta ya, kuba ya n’ụgbọala, sikwa ebe ahụ kuba ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ihi ya, ọtụtụ ụmụnna na-eke onwe ha eke inyere ya aka. Ha na-ewerekwa ya ka ihe ùgwù. A gaa ọmụmụ ihe, Kingsley na-edewe ígwè okwu n’akụkụ ntị ya, na-ege ntị nke ọma, na-azakwa ajụjụ.

Mgbe Kingsley mụrụ ihe ruo ọnwa ole na ole, o kpebiri idenye aha ya n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Mgbe ọ fọrọ izu abụọ ka o mee ihe omume mbụ ya, m jụrụ ya ma ọ̀ na-akwadokwa. Ya ejiri obi ike sị m, “Ee, Nwanna m, amụọla m ya ugboro iri atọ.” M jara ya mma maka mgbalị ya, sịzie ya gụọ ya ka m nụ. Ya emeghee Baịbụl ndị ìsì ya, tụkwasị ya aka, gụwa. Ma, m chọpụtara na ọ naghị atụ ihe ọ na-agụ aka otú ndị ìsì si eme. O burula ebe ahụ niile ọ ga-agụ n’isi.

Ihe ahụ tụrụ m n’anya, anya mmiri agbaa m. M jụrụ Kingsley otú o si nwee ike iburu ebe ahụ n’isi nke ọma ebe ọ bụ naanị ugboro iri atọ ka ọ mụrụ ya. Ya asị m: “Mba, m na-amụ ya ihe dị ka ugboro iri atọ kwa ụbọchị.” Kemgbe ihe karịrị otu ọnwa, Kingsley na-anọ na rọg na-amụ ihe omume ya, na-amụgharịkwa ya ruo mgbe o buuru ha niile n’isi.

Ụbọchị Kingsley ga-eme ihe omume ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mechara ruo. Mgbe o mechara ya, ụmụnna niile kụrụ aka dara ụda, anya mmiri gbakwara ọtụtụ ndị n’ihi mbọ nwanna a gbara. Otu nwanna nwaanyị nke kwụsịburu ime ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi n’ihi ụjọ gara gwa onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ka o denyeghachi aha ya. N’ihi gịnị? Ọ sịrị: “Ebe ọ bụ na Kingsley mere ya, m ga-emeli ya.”

Kingsley mụrụ ihe ruo afọ atọ. N’abalị isii n’ọnwa Septemba afọ 2008, e mere ya baptizim. O ji obi ya niile fegide Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ n’abalị iri na atọ n’ọnwa Mee afọ 2014. Obi siri Kingsley ike na ọ ga-ejere Jehova ozi na Paradaịs mgbe ọ ga-agbasi ike, ahụ́ adịkwa ya mma. (Aịza. 35:5, 6)—Akụkọ Paul McManus kọrọ.

a E bipụtara ya n’afọ 1995. Ma, a naghịzi ebipụta ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya