‘A Ga-ekwusa Ozi Ọma Nke A’!
1. Olee otú anyị si mara na ọ dịghị onye ga-akwụsịli ọrụ ikwusa ozi ọma?
1 O nweghị ihe ọ bụla ga-egbochili Jehova imezu uche ya. (Aịza. 14:24) Ọ bụ eziokwu na o yiri ka Gidiọn Onyeikpe na narị ndị ikom atọ, bụ́ ndị agha ya, agaghị emerili ndị agha Midian dị otu narị puku na iri puku atọ na puku ise, Jehova gwara ya, sị: “Ị ga-azọpụtakwa Izrel n’ọbụ aka Midian. Ọ́ bụghị m na-eziga gị?” (Ikpe 6:14) Olee ọrụ a na-arụ taa nke Jehova na-akwado? Jizọs sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mat. 24:14) Ọ dịghị onye ga-akwụsịli ọrụ a!
2. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Jehova ga-enyere onye ọ bụla n’ime anyị aka n’ozi ọma?
2 Jehova Na-enyere Onye Ọ Bụla n’Ime Anyị Aka: Ọ bụ eziokwu na obi siri anyị ike na Jehova ga-agọzi ozi Ndịàmà ya nọ n’ụwa niile na-ejere ya, ànyị kwesịrị ịtụ anya ka Jehova nyere anyị aka n’otu n’otu? N’otu oge ihe siiri Pọl ike n’ozi ya, ọ chọpụtara na Jehova si n’aka Ọkpara Ya, bụ́ Jizọs, nyere ya aka. (2 Tim. 4:17) Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-agọzikwa mbọ onye ọ bụla n’ime anyị na-agba ime uche ya.—1 Jọn 5:14.
3. Olee oge ndị Jehova na-enyere anyị aka ka anyị nwee ike ịga ozi ọma?
3 Ihe ndị i nwere ime n’ụbọchị hà na-eme ka ị ghara inwe ike ịga ozi ọma? “Ọ na-eme ka onye ike gwụrụ nwee ike.” (Aịza. 40:29-31) À na-emegide gị ma ọ bụ na-akpagbu gị? “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị.” (Ọma 55:22) Ò nwere mgbe ịga ozi ọma na-atụ gị ụjọ? “Gawa, mụ onwe m ga-anọnyere ọnụ gị.” (Ọpụ. 4:11, 12) Ị̀ na-arịa ọrịa na-anaghị ekwe gị gaa ozi ọma otú ị gaara achọ ịga? Jehova ji mbọ iji obi gị niile na-agba kpọrọ ihe n’agbanyeghị otú ọ hà, ọ na-agọzikwa ya.—1 Kọr. 3:6, 9.
4. Gịnị ka inwe obi ike n’ebe Jehova nọ ga-akpali anyị ime?
4 Jehova ‘agbatịwo aka ya, ònyekwa pụrụ ime ka o weghachi ya?’ (Aịza. 14:27) Ebe obi siri anyị ike na Jehova ga-agọzi ozi anyị, ka anyị “site n’ikike Jehova” na-ekwusa ozi ọma mgbe niile “n’atụghị egwu.”—Ọrụ 14:3.