Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 10
IZU NA-AMALITE NA MEE 10
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl:2 Samuel 4-8
Nke 1: 2 Samuel 6:1-13
Nke 2: Mmadụ na Ndị Ikwu Ya Nwụrụ Anwụ Hà Nwere Ike Ikwurịta Okwu (td 41CH)
Nke 3: Ihe Mere Anyaukwu Ji Bụrụ Ikpere Arụsị (Efe. 5:5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Nyere Ndị Nọ n’Ókèala Unu Aka n’Ụzọ Bara Uru. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle, nke si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 188, paragraf nke 4, ruo paragraf ikpeazụ dị na peeji nke 189. Jiri nkeji ole na ole gbaa otu nwanna ajụjụ ọnụ. Ọ ga-abụ onye ndị ọzọ gosiri mmasị n’ebe ọ nọ ma nyere ya aka inwe ọganihu.
Nkeji 10: Ụlọ Nzukọ Alaeze Dị Ọcha Na-enye Jehova Otuto. Okwu okenye ga-ekwu. Jehova bụ Chineke dị nsọ, n’ihi ya, ndị na-efe ya kwesịrị iji ịdị ọcha kpọrọ mkpa. (Ọpụ. 30:17-21; 40:30-32) Ọ bụrụ na anyị edewe Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ọcha, ma na-arụzi ihe ọ bụla mebiri na ya, anyị ga-ewetara Jehova otuto. (1 Pita 2:12) Gbaa nwanna na-ahụ maka idewe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha na ịrụzi ihe ndị mebiri na ya ajụjụ ọnụ. Kọọ ahụmahụ mere n’ókèala unu ma ọ bụkwanụ nke gbara n’akwụkwọ anyị banyere otú Ụlọ Nzukọ Alaeze e dewere ọcha si gbaa ezigbo àmà n’otu obodo. Gbaa mmadụ niile ume ka ha nye aka na-edewe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha.
Nkeji 10: “A Ga-ekwusa Ozi Ọma Nke A!” Ajụjụ na azịza.