Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite Eprel 30, 2012. Ụbọchị e denyere n’akara ngebichi bụ izu a ga-eme ihe omume e si na ya nweta ajụjụ ahụ. E denyere ya ka i nwee ike mee nchọnchọ n’izu ahụ a ga-amụ ya.
1. Gịnị mere akwụkwọ Baịbụl bụ́ Jeremaya ga-eji amasị anyị? [Mach 5, w07 3/15 p. 8 para. 2]
2. Olee otú Jehova pụrụ isi napụta anyị site ná mkpagbu taa? (Jere. 1:8) [Mach 5, w05 12/15 p. 23 para. 18]
3. Olee mgbe Ndị Kraịst e tere mmanụ laghachiri ‘n’okporo ụzọ ndị dịwara kemgbe oge ochie’? Oleekwa otú ha si laghachi na ya? (Jere. 6:16) [Mach 12, w05 11/1 p. 24 para. 12]
4. Olee ihe mere a ga-eji asị na e nwere ‘bọlsọm na Gilied’ taa? (Jere. 8:22) [Mach 19, w10 6/1 p. 22 para. 3–p. 23 para. 4]
5. Olee otú o si bụrụ na Jehova ‘na-agbanwe obi ya’ ma o kwuchaa ihe ọ ga-eme onye nupụụrụ ya isi? (Jere. 18:7, 8) [Epr. 2, jr p. 151, ọ bụ igbe]
6. Olee otú Jehova si ghọgbuo Jeremaya? Oleekwa ihe anyị kwesịrị ịmụta na ya? (Jere. 20:7) [Epr. 2, jr p. 36 para. 8]
7. Iwu e nyere na Jeremaya 22:30 ọ̀ kagburu oruru o ruuru Jizọs Kraịst ịnọkwasị n’ocheeze Devid? (Mat. 1:1, 11) [Epr. 9, w07 3/15 p. 10 para. 9]
8. Na Jeremaya 31:3, Jehova sị na ya “weere obiọma dọta” mba Izrel. Gịnị mere ihe ahụ o kwuru ji bụrụ eziokwu? [Epr. 23, jr p. 142-145 para. 8-11]
9. Olee otú e si ede iwu Chineke n’obi mmadụ? (Jere. 31:33) [Epr. 23, w07 3/15 p. 11 para. 2]
10. Olee ihe mere e ji ede akwụkwọ ala abụọ maka otu ala? (Jere. 32:10-15) [Epr. 30, w07 3/15 p. 11 para. 3]