Mkpụrụ Ego Abụọ nke Ga-Azụtali Ihe Dị Nta
Otu n’ime ụzọ ndị dị mkpa anyị si akwado ozi ọma Alaeze Chineke a na-ekwusa n’ụwa niile bụ inye ego n’onyinye. Ma, gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị dara ogbenye?
O nwere ụbọchị Jizọs gara n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ka ọ nọ na-ele ihe na-emenụ, ọ hụrụ ndị mmadụ ka ha na-atụnye ego n’igbe dị n’ụlọ nsọ ahụ. Ọ hụkwara otu nwaanyị di ya nwụrụ, nke dara ogbenye, ka ọ bịara tụnye obere mkpụrụ ego abụọ ga-azụtali ihe dị nta. Jizọs kwuru na nwaanyị ahụ “tụnyere ihe niile o nwere, . . . n’agbanyeghị na ọ nọ n’ụkọ.” Ihe mere o ji mee ya bụ maka na ọ hụrụ Jehova n’anya. (Mak 12:41-44) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na onyinye ahụ nwaanyị ahụ nyere hiri nne n’anya Chineke. Ndị Kraịst oge ochie ahapụghịkwa ụmụnna ha ndị nwere ego ka naanị ha jiri ego ha na-akwado ozi ọma a na-ekwusa n’oge ahụ. Pọl onyeozi kwuru gbasara àgwà ọma Ndị Kraịst nọ na Masedonia kpara. N’agbanyeghị na ha “dara ogbenye nke ukwuu,” ha rịọsiri Pọl na ndị òtù ya arịrịọ ike ‘ka ha kwe ka ha nwee ihe ùgwù nke iji obiọma na-enye ha ihe.’—2 Kọr. 8:1-4.
N’ihi ya, ọ ga-adị mma ma onye ọ bụla n’ime anyị si n’ala ala obi ya na-enye onyinye otú ike ya hà. A tụtụkọtacha ha, akpa eju. Ụdị onyinye a na-atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ n’ihi na ọ “hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.”—2 Kọr. 9:7.