Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na n’Eprel 30
IZU NA-AMALITE N’EPREL 30
Abụ nke 125 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 20 ¶1-7, igbe dị na p. 156 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jeremaya 32-34 (Nkeji 10)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ịma ọkwa. Jiri otu nkeji ma ọ bụ nkeji abụọ kwuo isiokwu ndị dị na magazin ndị a ga-enye n’ọnwa Mee, bụ́ ndị ga-amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwazie ụmụnna ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ na amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-10 n’Ụlọ Nche Mee 1 nye ya magazin ahụ. Ha kwuokwa ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ na amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-7 na Teta! Eprel–Jun nye ya magazin ahụ. Mezie ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche ahụ na Teta! ahụ.
Nkeji 15: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 4:1-13, 18-20. Tụleekwanụ otú amaokwu Baịbụl ndị ahụ nwere ike isi nyere anyị aka n’ozi ọma.
Nkeji 10: “Mkpụrụ Ego Abụọ nke Ga-Azụtali Ihe Dị Nta.” Okwu.
Abụ nke 126 na Ekpere