Abụ Ọma
Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Mọt-laben. Abụ olu ụtọ Devid.
א [Alef]
ב [Bet]
4 N’ihi na i mewo ka m nweta ikpe ziri ezi na ihe ruuru m;+
Ị nọdụwo n’ocheeze na-ekpe ikpe n’ezi omume.+
ג [Gimel]
5 Ị baworo mba dị iche iche mba,+ i bibiwo onye ajọ omume.+
I hichapụwo aha ha ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+
6 Gị onye iro, e bibiwo gị ruo mgbe ebighị ebi,+
Bibiekwa obodo ndị i fopụworo.+
A gakwaghị akpọtụ ha aha.+
ה [Hee]
ו [Wọọ]
9 Jehova ga-abụrụ onye ọ bụla e gburu mmụọ ya ebe dị elu e wusiri ike,+
Ebe dị elu e wusiri ike n’oge ahụhụ.+
ז [Zayin]
12 N’ihi na, mgbe ọ na-achọ ndị na-awụfu ọbara,+ ọ ga-echeta ndị nọ n’ahụhụ;+
Ọ dịghị ihe ga-eme ka o chefuo mkpu ákwá nke ndị nọ n’ahụhụ.+
ח [Het]
13 Jehova, biko, meere m amara; hụ ahụ́ ndị kpọrọ m asị na-emekpa m,+
Gị onye si n’ọnụ ụzọ ámá nke ọnwụ kulite m.+
14 Ka m wee kọọ akụkọ ihe niile kwesịrị otuto ị na-eme+
N’ọnụ ụzọ ámá+ nke ada bụ́ Zayọn,+
Ka m wee ṅụrịa ọṅụ ná nzọpụta gị.+
ט [Tet]
16 A marawo Jehova site n’ikpe o kpere.+
Ihe onye ajọ omume ji aka ya na-eme emewo ka ọnyà ma ya.+
Higeyọn. Sila.
י [Yod]
18 N’ihi na ọ bụghị mgbe niile ka a ga-echefu ogbenye,+
Ọ dịghịkwa mgbe olileanya ndị dị umeala n’obi ga-ala n’iyi.+
כ [Kaf]