Jona
2 Jona wee nọrọ n’afọ azụ̀+ ahụ kpekuo Jehova bụ́ Chineke ya ekpere 2 wee sị:
“N’ahụhụ ka m nọ kpọkuo Jehova,+ o wee za m.+
N’afọ Shiol ka m nọ tie mkpu maka enyemaka.+
Ị nụrụ olu m.+
3 Mgbe ị tụbara m n’ala ala mmiri, n’etiti ogbu oké osimiri,+
Oké osimiri wee kpuchie m.
Oké mmali mmiri na ebili mmiri gị niile—n’elu m ka ha gafere.+
6 N’ala ala ugwu ka m gbadara.
E ji ihe e ji atụchi elu ala tụchibido m ruo mgbe a na-akaghị aka.
Ma ị napụtara ndụ m n’olulu, Jehova bụ́ Chineke m.+
8 Ma ndị na-efe arụsị ụgha na-ahapụ onye na-egosi ha obiọma.*+
10 Ka oge na-aga, Jehova nyere azụ̀ ahụ iwu, o wee gbọpụta Jona n’ala akọrọ.+