Abụ Ọma
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ụmụ Kora.+
47 Unu ndị niile, kụọnụ aka.
Toonụ Chineke, tiekwanụ mkpu ọṅụ.
2 N’ihi na Jehova, Onye Kacha Elu, dị egwu.+
Ọ bụ nnukwu Eze nke na-achị ụwa niile.+
3 Ọ na-eme ka ndị dị iche iche nọrọ n’okpuru anyị.
Ọ na-eme ka anyị merie mba dị iche iche.+
4 Ọ bụ ya na-ahọtara anyị ebe anyị ga-eketa,+
Bụ́ ebe Jekọb, onye ọ hụrụ n’anya, ji anya isi.+ (Sila)
5 Chineke agbagorola mgbe ndị mmadụ na-eti mkpu ọṅụ.
Jehova agbagorola mgbe a na-afụ opi.*
6 Bụkuonụ Chineke abụ otuto. Bụọnụ abụ otuto.
Bụkuonụ Eze anyị abụ otuto. Bụọnụ abụ otuto.
7 N’ihi na Chineke bụ Eze na-achị ụwa niile.+
Bụkuonụ ya abụ otuto. Gosinụ na unu ma ihe.
8 Chineke aghọọla Eze na-achị mba niile.+
Chineke nọ n’ocheeze ya dị nsọ.
9 Ndị isi nke ndị dị iche iche
Na ndị nke Chineke Ebreham ezukọtala.
N’ihi na ọ bụ Chineke nwe ndị na-achị achị n’ụwa.*
Ọ nọ n’ebe dị ezigbo elu.+