5 O wee kpọpụta ya n’èzí wee sị: “Biko, lelie anya n’eluigwe gụọ kpakpando ndị a ọnụ, ma ọ bụrụ na i nwere ike ịgụta ha.”+ O wee gaa n’ihu ịsị ya: “Otú a ka mkpụrụ gị ga-adị.”+
4 Jehova wee sị ya: “Nke a bụ ala ahụ m ṅụụrụ Ebreham, Aịzik na Jekọb iyi inye ha, sị, ‘Mkpụrụ gị ka m ga-enye ya.’+ Emewo m ka i jiri anya gị hụ ya, n’ihi na ị gaghị agafe wee ruo ebe ahụ.”+
12 N’ihi ya, sitekwa n’aka otu nwoke,+ onye dị ka onye nwụrụ anwụ,+ a mụtara ụmụ dị nnọọ ọtụtụ ka kpakpando dị n’eluigwe nakwa dị ka ájá dị n’akụkụ oké osimiri, nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.+