20 Ma anụwo m ihe i kwuru banyere Ishmel. Lee! M ga-agọzi ya, m ga-emekwa ka ọ mụọ ọmụmụ, meekwa ka ọ mụbaa nnọọ nke ukwuu.+ Ọ ga-amụta ndị isi iri na abụọ, m ga-emekwa ka ọ ghọọ mba dị ukwuu.+
25 Ha wee nọdụ ala ka ha rie ihe oriri.+ Mgbe ha lepụrụ anya, lekwa ìgwè ndị njem bụ́ ndị Ishmel+ si Gilied na-abịa, kamel ha bukwa mmanụ labdanọm na mmanụ bọlsọm na ụgbụgbọ osisi nke nwere esó,+ ha bu ha na-aga Ijipt.