15 N’ihi na nnukwu onye nchụàjà anyị nwere abụghị onye na-apụghị imere anyị ebere+ n’adịghị ike anyị, kama ọ bụ onye a nwalere n’ụzọ niile dị ka anyị onwe anyị, ma o nweghị mmehie.+
7 ka okwukwe unu nke a nwalere anwale,+ nke bara oké uru karịa ọlaedo nke na-ala n’iyi, n’agbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya,+ wee bụrụ ihe na-eweta otuto na ebube na nsọpụrụ mgbe a ga-ekpughe+ Jizọs Kraịst.