4 N’eziokwu, ọ bụ ọrịa anyị ka ya onwe ya buuru;+ o bukwaara ihe mgbu anyị.+ Ma anyị gụrụ ya n’onye e tiri ihe otiti,+ onye Chineke tiri ihe,+ mekpaakwa ahụ́.+
61Mmụọ nke Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova dị n’ahụ́ m,+ n’ihi na Jehova etewo m mmanụ+ izi ndị dị umeala n’obi ozi ọma.+ O zitewo m ikechi ọnyá nke ndị e tiwara obi,+ ịkpọsara ndị a dọọrọ n’agha+ na a tọhapụwo ha, na imeghe anya ndị mkpọrọ;+
17 N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ọ dị ka “ụmụnna” ya n’ụzọ niile,+ ka o wee ghọọ nnukwu onye nchụàjà na-eme ebere, nke kwesịrị ntụkwasị obi n’ijere Chineke ozi,+ ka o wee chụọ àjà ime udo+ maka mmehie nke ndị mmadụ.+