5N’ihi na nnukwu onye nchụàjà ọ bụla nke e si n’etiti ụmụ mmadụ họrọ bụ onye a họpụtara ijere Chineke ozi+ n’ihi ụmụ mmadụ, ka o wee na-eche onyinye n’ihu ya, na-achụkwa àjà maka mmehie.+
26 N’ihi na ụdị nnukwu onye nchụàjà a kwesịrị anyị,+ onye na-eguzosi ike n’ihe,+ onye na-adịghị aghụghọ,+ onye a na-emerụghị emerụ,+ onye e kewapụrụ n’ebe ndị mmehie nọ,+ o wee dị elu karịa eluigwe.+