8 M ga-enyekwa gị na mkpụrụ gị nke ga-anọchi gị ala dị iche iche i biri dị ka ọbịa,+ bụ́ ala Kenan dum, ka ọ bụrụ ihe onwunwe gị ruo mgbe a na-akaghị aka; m ga-egosikwa na m bụ Chineke ha.”+
9 O ji okwukwe biri dị ka ọbịa n’ala nkwa ahụ dị ka à ga-asị na o bi n’ala ọzọ,+ biekwa n’ụlọikwuu,+ ya na Aịzik+ na Jekọb,+ bụ́ ndị ha na ya na-eketa otu nkwa ahụ.+