2 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Gwa Erọn nwanne gị nwoke na ọ bụghị mgbe niile ka ọ ga na-abata n’ebe nsọ,+ n’ime ákwà mgbochi ahụ,+ n’ihu ihe mkpuchi e ji kpuchie Igbe ahụ, ka ọ ghara ịnwụ;+ n’ihi na m ga na-apụta n’ígwé ojii+ n’elu ihe mkpuchi ahụ.+
7 Gị na ụmụ gị ga-echekwa ọrụ unu na-arụ dị ka ndị nchụàjà n’ihe ọ bụla metụtara ebe ịchụàjà nakwa n’ihe metụtara ihe dị n’ime ákwà mgbochi ahụ;+ unu ga na-eje ozi.+ M ga-enye unu ọrụ ịbụ ndị nchụàjà dị ka onyinye, onye nkịtị nke bịara nso, a ga-egbu ya.”+