8 Otú a ga-esi kwee efọd ahụ ka a ga-esi kwee eriri+ ya nke ga-adị n’elu ya iji na-ekesi ya ike, a ga-ejikwa otu ihe ahụ e ji kwee efọd ahụ, bụ́ ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin a kpara akpa, kwee ya.