43 Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eyi ya mgbe ha na-abanye n’ụlọikwuu nzute ma ọ bụ mgbe ha na-agaru ebe ịchụàjà ahụ iji jee ozi n’ebe nsọ ahụ, ka ha wee ghara ibutere onwe ha njehie wee nwụọ. Ọ bụ ụkpụrụ ga-adịrị ya na ụmụ ya ga-anọchi ya, ruo mgbe a na-akaghị aka.+
6 Ọ rụkwara efere iri, ọ dọsara ise n’aka nri, dọsa ise n’aka ekpe,+ ka e were ha na-asa ihe.+ Ọ bụ ihe ndị metụtara àjà nsure ọkụ+ ka a na-asa na ha. Ma oké osimiri ahụ bụ ka ndị nchụàjà jiri ya na-asa ahụ́.+