25 Ị ga-akpọ ihe oyiyi a pịrị apị nke chi ha ọkụ.+ Ka agụụ ọlaọcha na ọlaedo dị na ha ghara ịgụ gị,+ ewerekwala ya,+ ka ọ ghara ịmata gị n’ọnyà;+ n’ihi na ọ bụ ihe arụ+ n’anya Jehova bụ́ Chineke gị.
21 Ebuuru m mmehie ahụ unu mere, ya bụ, nwa ehi+ ahụ, m wee kpọọ ya ọkụ ma gwerie ya, m gweriri ya nke ọma ruo mgbe ọ dị ka uzuzu; e mesịa, m wụnyere ntụ ya n’ime iyi nke si n’ugwu ahụ na-asọdata.+
6 O sikwa n’ụlọ Jehova bupụta ogwe osisi ahụ dị nsọ,+ buga ya ná mpụga Jeruselem, na ndagwurugwu Kidrọn, wee suo ya ọkụ+ na ndagwurugwu Kidrọn, gweriekwa ya ka ọ ghọọ ntụ ma wụfuo ya n’ebe a na-eli+ ndị nkịtị.