17 N’ihi na nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’etiti ụmụ Izrel bụ nke m, ma mmadụ ma anụmanụ.+ N’ụbọchị m gburu ụmụ niile e bu ụzọ mụọ n’ala Ijipt+ ka m doro ha nsọ ka ha bụrụ nke m.+
19 “Ị ga-edo nke ọ bụla bụ́ oké e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi gị nakwa n’ìgwè ewu na atụrụ gị nsọ nye Jehova bụ́ Chineke gị.+ Ejila ehi gị e bu ụzọ mụọ rụọ ọrụ, akpachakwala ajị ewu na atụrụ gị e bu ụzọ mụọ.+