8 O wee ruo na ozugbo anwụ wara, Chineke mekwara ka ifufe+ dị ọkụ nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ fee, anwụ wee na-acha Jona n’isi nke ukwuu, o wee malite ịtụbọ;+ o wee na-arịọ ka ya nwụọ, ọ nọkwa na-ekwu ọtụtụ ugboro, sị: Ọ kaara m mma ịnwụ anwụ karịa na m dị ndụ.”+