21 N’ụlọikwuu nzute, ná mpụga ákwà mgbochi+ ahụ nke dị n’akụkụ Ihe Àmà ahụ, Erọn na ụmụ ya ga na-elekọta ya ka ọ na-enwu malite ná mgbede ruo ụtụtụ n’ihu Jehova.+ Ọ bụ ụkpụrụ dịịrị ọgbọ+ ha niile ruo mgbe a na-akaghị aka, nke ụmụ Izrel ga na-edebe.+
6 Ị ga-edebe ya n’ihu ákwà mgbochi ahụ nke dị nso n’igbe ihe àmà ahụ,+ n’ihu ihe mkpuchi nke e ji kpuchie Ihe Àmà ahụ, bụ́ ebe m ga-apụta ìhè n’ihu gị.+
9 Ọ dịghị ihe dị n’Igbe ahụ ma e wezụga mbadamba nkume abụọ+ nke Mozis debere+ na ya na Horeb, mgbe Jehova na ụmụ Izrel gbara ndụ,+ ka ha si n’ala Ijipt na-apụta.+