10 “‘Ọ dịghị onye nkịtị ga-eri ihe ọ bụla dị nsọ.+ Ọ dịghị onye mbịarambịa ya na onye nchụàjà bi ma ọ bụ onye ọrụ e goro ego nke ga-eri ihe ọ bụla dị nsọ.
6 Onye nchụàjà ahụ wee nye ya ihe dị nsọ,+ n’ihi na ọ dịghị achịcha dị n’ebe ahụ ma e wezụga achịcha a na-eche n’ihu Chineke, bụ́ nke e wepụrụ n’ihu Jehova+ ka e wee debe achịcha e mere ọhụrụ n’ebe ahụ n’ụbọchị e wepụrụ ya.
4 Ọ̀ bụ na ọ banyeghị n’ụlọ Chineke, ha wee rie achịcha e chere n’ihu Chineke,+ bụ́ ihe iwu na-akwadoghị+ ka o rie, ma ọ bụ ka ndị ahụ so ya rie, ma e wezụga naanị ndị nchụàjà?+
4 Ọ̀ bụ na ọ banyeghị n’ụlọ Chineke ma nara achịcha e chere n’ihu Chineke+ rie, nyetụkwa ndị ikom so ya, bụ́ nke iwu na-akwadoghị ka onye ọ bụla rie ma e wezụga naanị ndị nchụàjà?”+