10 Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike nye Jehova bụ́ Chineke gị.+ Arụla ọrụ ọ bụla, gị onwe gị ma ọ bụ nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị, ohu gị nwoke ma ọ bụ ohu gị nwaanyị ma ọ bụ anụ ụlọ gị ma ọ bụ onye mbịarambịa nke bi n’obodo gị.+
13 “Ma gị onwe gị, gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Unu ga-edebe ụbọchị izu ike m karịsịa,+ n’ihi na ọ bụ ihe ịrịba ama n’etiti mụ na unu n’ọgbọ niile unu ka unu wee mara na mụ onwe m bụ Jehova onye na-edo unu nsọ.+