23 O wee ruo n’ime ogologo oge ahụ na eze Ijipt mesịrị nwụọ,+ ma ụmụ Izrel nọ na-asụ ude n’ihi ohu ha na-agba, ha kwakwara ákwá mkpesa,+ mkpu enyemaka ha na-eti nọ na-arịgokwuru ezi Chineke n’ihi ohu ha na-agba.+
7 Jehova kwukwara, sị: “N’ezie, ahụwo m ahụ́ a na-emekpa ndị m bụ́ ndị nọ n’Ijipt, anụwokwa m mkpu ákwá ha na-eti n’ihi ndị na-amanye ha ịrụ ọrụ; n’ihi na m maara nnọọ ihe mgbu ha na-enwe.+