30 Ma Saịhọn eze Heshbọn ekweghị ka anyị si n’ala ya gafere, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị kwere ka mmụọ ya sie ike+ nakwa ka obi kpọọ ya nkụ, ka o wee nyefee ya n’aka gị dị nnọọ ka ọ dị taa.+
20 Saịhọn ejighị n’aka ma ọ̀ bụ ngafe ka Izrel chọrọ isi n’ókèala ya gafere, Saịhọn wee gaa kpọkọta ndị ya niile, maa ụlọikwuu na Jehaz+ wee buso Izrel agha.+