3 “‘Ọ bụrụ na àjà ya bụ àjà nsure ọkụ+ nke a ga-eji anụ si n’ìgwè ehi chụọ, ọ ga-eweta oké, nke ahụ́ dị mma.+ N’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute ka ọ ga-eji obi ya chee ya n’ihu Jehova.+
8 Unu ga-eweta otu nwa oké ehi, otu ebule, ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ,+ ka ha bụrụ àjà nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke a chụụrụ Jehova. Ha ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+