Ọnụ Ọgụgụ
29 “‘N’ọnwa nke asaa, n’abalị mbụ n’ọnwa ahụ, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ.+ Unu arụla ụdị ọrụ ọ bụla siri ike.+ Ọ ga-abụ ụbọchị a ga-afụrụ unu opi.+ 2 Unu ga-achụ otu nwa oké ehi, otu ebule, ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ, ndị ahụ́ dị mma, n’àjà, ka ha bụrụ àjà nsure ọkụ nke na-esi ísì ụtọ nye Jehova;+ 3 chụọkwa àjà ọka* ha, bụ́ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, a ga-eji ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa chụọ oké ehi ahụ n’àjà, jirikwa ụzọ abụọ n’ụzọ iri chụọ ebule ahụ n’àjà,+ 4 a ga-ejikwa otu ụzọ n’ụzọ iri chụọ nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule asaa ahụ n’àjà;+ 5 chụọkwa otu nwa mkpi n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie iji kpuchiere unu mmehie;+ 6 ma e wezụga àjà nsure ọkụ+ a na-achụ kwa ọnwa na àjà ọka+ ya, na àjà nsure ọkụ a na-achụ mgbe niile+ na àjà ọka ya,+ tinyere àjà ihe ọṅụṅụ ha,+ dị ka usoro ha si dị, ka ha bụrụ ihe na-esi ísì ụtọ, àjà a na-esurere Jehova n’ọkụ.+
7 “‘N’abalị iri n’ọnwa asaa nke a, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ,+ unu ga-emekpa mkpụrụ obi unu ahụ́.+ Unu arụla ụdị ọrụ ọ bụla.+ 8 Unu ga-eweta otu nwa oké ehi, otu ebule, ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ,+ ka ha bụrụ àjà nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke a chụụrụ Jehova. Ha ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 9 Wetakwanụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ka ọ bụrụ àjà ọka ha, ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ga-abụ maka oké ehi ahụ, ụzọ abụọ n’ụzọ iri ga-abụ maka otu ebule,+ 10 otu ụzọ n’ụzọ iri ga-abụ maka nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule asaa ahụ;+ 11 otu nwa ewu ga-abụ maka àjà mmehie, ma e wezụga àjà mmehie nke ikpuchi mmehie+ na àjà nsure ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya, tinyere àjà ihe ọṅụṅụ ha.+
12 “‘N’abalị iri na ise n’ọnwa nke asaa+ ka unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ.+ Unu arụla ụdị ọrụ ọ bụla siri ike,+ unu ga-emekwara Jehova ememme ruo ụbọchị asaa.+ 13 Unu ga-ewetakwa ụmụ oké ehi iri na atọ, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, ka ọ bụrụ àjà nsure ọkụ,+ àjà a na-esure n’ọkụ, nke na-esi ísì ụtọ nye Jehova. Ha ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 14 Wetakwanụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ka ọ bụrụ àjà ọka ha, ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ga-abụ maka nke ọ bụla n’ime oké ehi iri na atọ ahụ, ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ga-abụ maka nke ọ bụla n’ime ebule abụọ ahụ,+ 15 otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ga-abụkwa maka nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule+ iri na anọ ahụ; 16 wetakwa otu nwa ewu ka ọ bụrụ àjà mmehie, ma e wezụga àjà nsure ọkụ a na-achụ mgbe niile, àjà ọka ya nakwa àjà ihe ọṅụṅụ ya.+
17 “‘N’ụbọchị nke abụọ, unu ga-eweta ụmụ oké ehi iri na abụọ, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, ndị ahụ́ dị mma;+ 18 tinyere àjà ọka+ ha na àjà ihe ọṅụṅụ+ ha maka oké ehi ndị ahụ, ebule ndị ahụ na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka ọnụ ọgụgụ ha si dị, dịkwa ka usoro ha si dị;+ 19 wetakwa otu nwa ewu ka ọ bụrụ àjà mmehie,+ ma e wezụga àjà nsure ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya, tinyere àjà ihe ọṅụṅụ ha.+
20 “‘N’ụbọchị nke atọ, unu ga-eweta ụmụ oké ehi iri na otu, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, ndị ahụ́ dị mma;+ 21 tinyere àjà ọka+ ha na àjà ihe ọṅụṅụ+ ha maka oké ehi ndị ahụ, ebule ndị ahụ na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka ọnụ ọgụgụ ha si dị, dịkwa ka usoro ha si dị; 22 wetakwa otu ewu ka ọ bụrụ àjà mmehie,+ ma e wezụga àjà nsure ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya, na àjà ihe ọṅụṅụ ya.
23 “‘N’ụbọchị nke anọ, unu ga-eweta oké ehi iri, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, ndị ahụ́ dị mma;+ 24 àjà ọka+ ha na àjà ihe ọṅụṅụ+ ha maka oké ehi ndị ahụ, ebule ndị ahụ na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka ọnụ ọgụgụ ha si dị, dịkwa ka usoro ha si dị;+ 25 wetakwa otu nwa ewu ka ọ bụrụ àjà mmehie,+ ma e wezụga àjà nsure ọkụ+ a na-achụ mgbe niile, àjà ọka ya, na àjà ihe ọṅụṅụ ya.+
26 “‘N’ụbọchị nke ise, unu ga-eweta oké ehi itoolu, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, ndị ahụ́ dị mma;+ 27 wetakwa àjà ọka+ ha na àjà ihe ọṅụṅụ+ ha maka oké ehi ndị ahụ, ebule ndị ahụ na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka ọnụ ọgụgụ ha si dị, dịkwa ka usoro ha si dị;+ 28 wetakwa otu ewu ka ọ bụrụ àjà mmehie,+ ma e wezụga àjà nsure ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya, na àjà ihe ọṅụṅụ ya.+
29 “‘N’ụbọchị nke isii, unu ga-eweta oké ehi asatọ, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, ndị ahụ́ dị mma;+ 30 wetakwa àjà ọka+ ha na àjà ihe ọṅụṅụ+ ha maka oké ehi ndị ahụ, ebule ndị ahụ na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka ọnụ ọgụgụ ha si dị, dịkwa ka usoro ha si dị;+ 31 wetakwa otu ewu ka ọ bụrụ àjà mmehie,+ ma e wezụga àjà nsure ọkụ a na-achụ mgbe niile, àjà ọka ya, na àjà ihe ọṅụṅụ ya.+
32 “‘N’ụbọchị nke asaa, unu ga-eweta oké ehi asaa, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, ndị ahụ́ dị mma;+ 33 wetakwa àjà ọka+ ha na àjà ihe ọṅụṅụ+ ha maka oké ehi ndị ahụ, ebule ndị ahụ na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka ọnụ ọgụgụ ha si dị, dịkwa ka usoro ha si dị;+ 34 wetakwa otu ewu ka ọ bụrụ àjà mmehie,+ ma e wezụga àjà nsure ọkụ a na-achụ mgbe niile, àjà ọka ya, na àjà ihe ọṅụṅụ ya.+
35 “‘N’ụbọchị nke asatọ, unu ga-enwe nzukọ ukwu.+ Unu arụla ụdị ọrụ ọ bụla siri ike.+ 36 Unu ga-ewetakwa otu oké ehi, otu ebule, ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ, ndị ahụ́ dị mma,+ ka ha bụrụ àjà nsure ọkụ, àjà a na-esure n’ọkụ, nke na-esi ísì ụtọ nye Jehova; 37 wetakwa àjà ọka+ ha na àjà ihe ọṅụṅụ+ ha maka oké ehi ahụ, ebule ahụ na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka ọnụ ọgụgụ ha si dị, dịkwa ka usoro ha si dị;+ 38 wetakwa otu ewu ka ọ bụrụ àjà mmehie,+ ma e wezụga àjà nsure ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya, na àjà ihe ọṅụṅụ ya.+
39 “‘Ihe ndị a ka unu ga na-achụrụ Jehova n’àjà mgbe unu na-eme ememme unu n’oge a kara aka,+ ma e wezụga onyinye unu kwere ná nkwa+ na onyinye afọ ofufo+ unu ga na-achụ n’àjà dị ka àjà nsure ọkụ+ unu na àjà ọka+ unu na àjà ihe ọṅụṅụ+ unu na àjà udo unu.’”+ 40 Mozis wee gwa ụmụ Izrel ihe niile Jehova nyere Mozis n’iwu.+