29 “Ọ ga-abụrụ unu ụkpụrụ na-adịru mgbe a na-akaghị aka:+ N’ọnwa nke asaa, n’abalị iri n’ọnwa ahụ,+ unu ga-emekpa mkpụrụ obi unu ahụ́,+ unu arụla ọrụ ọ bụla,+ ma nwa afọ ma onye mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa n’etiti unu.
5 Ibu ọnụ nke m chọrọ ò kwesịrị ịdị otú a, ya bụ, ụbọchị mmadụ na-emekpa mkpụrụ obi ya ahụ́,+ ụbọchị mmadụ na-ehulata isi ya dị ka ahịhịa amị, gbasaa ákwà iru uju, kposaakwa ntụ ka ha bụrụ ihe ndina ya?+ Ọ̀ bụ ihe a ka unu na-akpọ ibu ọnụ na ụbọchị dị Jehova mma?+