Abụ Ọma
Abụ ọma Devid.
35 Jehova, biko, kpechite ọnụ m n’ikpe mụ na ndị na-emegide m nwere;+
Buso ha agha, bụ́ ndị na-ebuso m agha.+
2 Buru obere ọta na ọta ukwu,+
Biliekwa nyere m aka,+
3 Were ube na anyụike ihu abụọ zute ndị na-achụ m ọsọ.+
Sị mkpụrụ obi m: “Abụ m nzọpụta gị.”+
4 Ka ihere mee ndị na-achụ nta mkpụrụ obi m, ka e mechuokwa ha ihu.+
Ka e mee ka ndị na-eme atụmatụ ka ọdachi dakwasị m laghachi azụ, ka ihere meekwa ha.+
7 N’ihi na ha egwuwo olulu were ụgbụ kpuchie ya ka m daba n’ime ya n’enweghị ihe m mere ha;+
Ha gwuuru ya mkpụrụ obi m n’enweghị ihe m mere ha.+
“Jehova, ònye dị ka gị?+
Gị onye na-anapụta onye nọ n’ahụhụ n’aka onye ka ya ike,+
Ị na-anapụtakwa onye nọ n’ahụhụ na ogbenye n’aka onye na-apụnara ya ihe.”+
13 Ma mụ onwe m, mgbe ha dara ọrịa, uwe m bụ ákwà iru uju,+
Eji m ibu ọnụ mekpaa mkpụrụ obi m ahụ́,+
Ekpere m lọghachikwutere m.+
14 Echegburu m onwe m banyere ha dị ka à ga-asị na ha bụ enyi m na nwanne m,+
N’ihi ya, ejegharịrị m dị ka onye na-eruru nne ya uju.+
Obi dara m mbà n’ihi ịnọ ná mwute.
15 Mgbe m na-ete ụkwụ, ha ṅụrịrị ọṅụ wee gbakọọ;+
Ha gbakọrọ imegide m,+
Tituo m na mberede;+
Ha dọriri m, ha emechighị ọnụ.+
16 Ndị si n’ezi ofufe dapụ bụ́ ndị na-akwa emo iji nweta ntakịrị ihe oriri+
Na-ata ikikere ezé megide m.+
17 Jehova, ruo ole mgbe ka ị ga na-ahụ ya?+
Biko, napụta mkpụrụ obi m ná mbibi ha na-eweta,+
Napụta otu ihe a m nwere+ n’aka ụmụ ọdụm tojuru etoju.
19 Biko, ekwela ka ndị bụ́ ndị iro m n’enweghị ihe m mere ha ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m;+
Ekwela ka ndị kpọrọ m asị na nkịtị tabie anya.+
20 N’ihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu;+
Kama ọ bụ okwu aghụghọ ka ha na-echepụta+
Megide ndị nọ jụụ n’ụwa.
24 Jehova Chineke m, biko, kpee m ikpe dị ka ezi omume gị si dị,+
Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m.+
25 Biko, ekwela ka ha sị n’obi ha: “Ntọọ, ọ bụ ihe mkpụrụ obi anyị chọrọ!”+
Ekwela ka ha sị: “Anyị elodawo ya.”+
26 Ka ihere mee ha, ka e mechuokwa ha niile ihu,+
Bụ́ ndị na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ọdachi m.+
Ka ndị na-ebuli onwe ha elu megide m+ yiri ihere+ na mweda n’ala dị ka uwe.