28 Ha ga-abụ nke Erọn na nke ụmụ ya dị ka ụkpụrụ ga-adịru mgbe a na-akaghị aka nke ụmụ Izrel ga na-edebe, n’ihi na ọ bụ òkè dị nsọ;+ ọ ga-abụkwa òkè dị nsọ nke ụmụ Izrel ga na-enye. Ọ bụ òkè ha dị nsọ nke dịịrị Jehova site n’àjà udo ha.+
8 Jehova wee gwa Erọn okwu ọzọ, sị: “Lee, mụ onwe m enyewo gị ọrụ ịhụ maka onyinye a na-enye m.+ Ọ bụ ya bụ òkè m nyere gị na ụmụ gị n’ime ihe nsọ niile nke ụmụ Izrel, ka ọ bụrụ òkè unu ruo mgbe a na-akaghị aka.+