5“‘Ọ bụrụ na mkpụrụ obi+ emehie site n’ịnụ ka a nọ n’ihu ọha na-abụ ọnụ,+ o wee bụrụ na ọ nọ mgbe o mere, ma ọ bụ, na ọ hụrụ ya ma ọ bụ mara banyere ya, ma o kwughị ya,+ ọ ga-aza ajụjụ maka njehie ya.
3 “Nna anyị nwụrụ n’ala ịkpa,+ ma o soghị n’òtù Kora+ bụ́ ndị zukọtara megide Jehova, kama ọ nwụrụ n’ihi mmehie nke ya;+ ọ mụtaghịkwa nwa nwoke ọ bụla.
20 Mkpụrụ obi ọ bụla nke na-emehie, ọ bụ ya ga-anwụ.+ Nwata agaghị aza ajụjụ ọ bụla maka njehie nna ya, nna agaghịkwa aza ajụjụ ọ bụla maka njehie nwa ya.+ Ezi omume nke onye ezi omume ga-adị n’isi ya,+ ajọ omume nke onye ajọ omume ga-adịkwa n’isi ya.+