Levitikọs 2:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Ihe fọdụrụ n’àjà ọka ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya,+ dị ka ihe kasị nsọ+ nke si n’àjà a na-esurere Jehova n’ọkụ. Levitikọs 6:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 Erọn na ụmụ ya ga-erikwa ihe fọdụrụ na ya.+ A ga-anọ n’ebe dị nsọ rie ya n’ụdị achịcha na-ekoghị eko.+ Ha ga-anọ n’ogige ụlọikwuu nzute rie ya. Levitikọs 10:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 Mozis wee gwa Erọn, gwakwa Elieza na Ịtama bụ́ ụmụ ya ndị fọdụrụ, sị: “Werenụ àjà ọka*+ fọdụrụ n’àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova, nọrọkwanụ nso n’ebe ịchụàjà rie ya n’etinyeghị ya ihe na-eko achịcha, n’ihi na ọ bụ ihe kasị nsọ.+
3 Ihe fọdụrụ n’àjà ọka ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya,+ dị ka ihe kasị nsọ+ nke si n’àjà a na-esurere Jehova n’ọkụ.
16 Erọn na ụmụ ya ga-erikwa ihe fọdụrụ na ya.+ A ga-anọ n’ebe dị nsọ rie ya n’ụdị achịcha na-ekoghị eko.+ Ha ga-anọ n’ogige ụlọikwuu nzute rie ya.
12 Mozis wee gwa Erọn, gwakwa Elieza na Ịtama bụ́ ụmụ ya ndị fọdụrụ, sị: “Werenụ àjà ọka*+ fọdụrụ n’àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova, nọrọkwanụ nso n’ebe ịchụàjà rie ya n’etinyeghị ya ihe na-eko achịcha, n’ihi na ọ bụ ihe kasị nsọ.+