4 Mgbe ndị Izrel si n’Ugwu Họọ+ jiri ụkwụ na-aga n’ụzọ Oké Osimiri Uhie ka ha gaa nkọnkọ nkọnkọ gafere ala Idọm,+ ike malitere ịgwụ mkpụrụ obi ha n’ihi ụzọ ahụ.
18 Mgbe ha si n’etiti ala ịkpa na-aga, ha gara ala Idọm+ na ala Moab nkọnkọ nkọnkọ, ha wee gaa n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ala Moab+ wee maa ụlọikwuu ha n’ógbè Anọn; ha abịaghịkwa nso n’ókè nke ala Moab,+ n’ihi na Anọn bụ ókè nke ala Moab.+