35 O wee ruo na, mgbe ọ hụrụ ya, ọ dọwara uwe ya,+ sị: “Ewoo, ada m! I meela ka obi gbawaa m, mụ onwe m ebutewokwara gị nsogbu. Mụ onwe m emegheworo Jehova ọnụ m, enweghịkwa m ike ịgbanwe ihe m kwuru.”+
24 Ihe taara ndị Izrel akpụ n’ụbọchị ahụ, n’agbanyeghịkwa nke ahụ, Sọl mere ka ha ṅụọ iyi,+ sị: “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ga-eri ihe tupu anyasị bụ, ruokwa mgbe m ga-abọworị ọbọ+ n’ahụ́ ndị iro m!” Ọ dịghịkwa onye ọ bụla detụrụ nri ire.+