13 Anyanwụ wee guzo otu ebe, ọnwa akwụrụkwa otu ebe, ruo mgbe mba ahụ bọrọ ọbọ n’ahụ́ ndị iro ya.+ Ọ̀ bụ na e deghị ya n’akwụkwọ Jesha?+ Anyanwụ wee kwụrụ otu ebe n’etiti eluigwe, ọ daghịkwa ngwa ngwa ruo ihe dị ka otu ụbọchị zuru ezu.+
36 Ma ọ sịrị ya: “Nna m, ọ bụrụ na i megheworo Jehova ọnụ gị, mee m ihe si n’ọnụ gị pụta,+ ebe ọ bụ na Jehova abọworo gị ọbọ n’ahụ́ ndị iro gị, bụ́ ụmụ Amọn.”
28 Samsịn+ wee kpọkuo Jehova,+ sị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, biko, cheta m,+ biko, nye m ike,+ naanị otu ugboro a, gị ezi Chineke, ka m bọọrọ onwe m ọbọ n’ahụ́ ndị Filistia maka otu n’ime anya m abụọ.”+