24 N’ihi na ọ bụ naanị ndị ikom ole na ole ka ndị agha Siria ji wakpo+ obodo ahụ, Jehova wee nyefee ndị agha dị nnọọ ọtụtụ n’aka ha,+ n’ihi na ha hapụrụ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha; ha mekwara ihe e kpere n’ikpe n’ahụ́ Jehoash.+
17 Otu puku mmadụ ga-ama jijiji n’ihi ịba mba nke otu onye;+ n’ihi ịba mba nke mmadụ ise, unu ga-agbakata ọsọ ruo mgbe ndị fọdụrụ n’etiti unu ga-adị ka osisi ákwà ụgbọ mmiri nke dị n’elu ugwu, dịkwa ka ihe mgbaàmà e gwunyere n’elu ugwu.+