8 O wee ruo na ozugbo Jihu malitere imezu ihe e kpere n’ikpe megide ụlọ Ehab,+ ọ hụrụ ndị bụ́ ndị isi na Juda na ụmụ ụmụnne Ehazaya,+ bụ́ ndị na-ejere Ehazaya ozi, wee gbuo ha.+
12 Jehova, ọ́ bụghị kemgbe ogologo oge gara aga ka ị dị?+ Chineke m, Onye Nsọ m, ị dịghị anwụ anwụ.+ Jehova, i mewo ya ka ọ dịrị maka ikpe ikpe ziri ezi; Oké Nkume,+ ọ bụkwa maka ịdọ aka ná ntị+ ka ị tọrọ ntọala ya.