21 Ọ bụkwa n’ihu Elieza onye nchụàjà ka ọ ga na-eguzo, ọ ga na-ajụtara ya ase+ n’ihu Jehova site ná mkpebi ikpe nke Yurim.+ Ọ bụ ya ga na-agwa ha mgbe ha ga na-apụ na mgbe ha ga na-abata, ya na ụmụ Izrel niile na nzukọ ahụ dum.”
17 Na-eruberenụ ndị na-edu ndú n’etiti unu isi,+ na-anọkwanụ n’okpuru ha,+ n’ihi na ha na-eche mkpụrụ obi unu nche dị ka ndị ga-aza ajụjụ;+ ka ha wee jiri ọṅụ na-eme nke a, ọ bụghị ịsụ ude, n’ihi na nke a ga-emebiri unu ihe.+