14 Chineke wee gwa Mozis, sị: “M GA-ABỤ IHE M CHỌRỌ ỊBỤ.”+ O kwukwara, sị: “Nke a bụ ihe ị ga-agwa ụmụ Izrel, ‘M GA-ABỤ ezitewo m ka m bịakwute unu.’”+
7 M ga-akpọta unu n’ebe m nọ dị ka otu ndị,+ m ga-egosikwa na mụ onwe m bụ Chineke unu;+ unu ga-amara na mụ onwe m bụ Jehova bụ́ Chineke unu onye na-akpọpụta unu n’ibu arọ Ijipt.+