13 Mozis wee sị ndị Izrel: “Unu atụla egwu.+ Guzosienụ ike hụ nzọpụta Jehova, nke ọ ga-azọpụta unu taa.+ N’ihi na ndị Ijipt a unu na-ahụ taa, unu agaghị ahụ ha ọzọ, ee e, ọ dịghị mgbe unu ga-ahụ ha ọzọ.+
17 Chineke nke ndị a bụ́ ndị Izrel họọrọ nna nna anyị hà, o bulikwara ha elu n’oge ha biri dị ka ndị ala ọzọ n’ala Ijipt ma jiri ogwe aka dị ike kpọpụta ha na ya.+